Dog News in Lagos: Ọrịa ise ị nwereike ibute maọbụrụ na ị dina anụmanụ

Ebe foto si, Getty Images
Anụmanụ na mmadụ na-ebikọ mana ị ma na o nwere ọrịa mmadụ nwerike ibute maọbụrụ na ya na anụmanụ mekọọ.
Blessing Ngozi Joachin bụ dọkita na-ahụ maka anụmanụ na ahụike ha kwuru na ụfọdụ mmadụ na-ewe anụmanụ dịka ọyị makana ha enweghị ezinụlọ tụmadị maọbụrụ na mba ofesi.
Dọkịta Joachin kwuru na uru anụmanụ bara mmadụ gụnyere nchekwa, ịchọpụta ihe ọjọọ maọbụ ịzụọ ha ka ha na-ejere gị ozi.
E kwesighị ikwute ya na ntị, na mmadụ na anụmanụ na-enwe aramara makana ọ bụ arụ dịka dọkịta Ngozi si kwuo.
O kwuru na nke a pụtara na mmadụ nwerike ibute ọtụtụ ọrịa ma ya na anụmanụ nwe aramara.
Kedụ ihe butere nkuzi a?
Otu onye Naịjirịa nọ na twitter tinyere onyonyo gosiri ebe nkịta na ụmụnwaanyị na-enwe aramara na Lagos.
O depụtara na ụmụnwanyị ahụ na-ata ego ruru otu nde naira na ụma maka ikwe ka ha na nkịta nwe aramara.
Nke a mere ka ọtụtụ mmadụ bido katọwa ma kwuwe maka atụmaatụ a na soshal midia.

Ebe foto si, Twiiter Screen grab
@Shallar depụtara ihe akwụkwọ kwuru maka atụmaatụ a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Lee ọrịa ndị ahụ mmadụ nwerike ibute ma ha na anụmanụ nwee aramara
Dọkịta Uche Alagboso bụ onye na-ahụ maka ahụike anụmanụ kwuputere ọria ole na ole ndị a:
Akpụkpa(Rabbies na bekee)
Akpụkpa bụ ọrịa mmadụ nwerike ibute maọbụrụ na ya na nkịta nwee aramara.
Dọkịta Uche kwuru na nke bụ makana a na-ebute ọrịa Rabbies site na asọ mmiri, okpofu maọbụ mmiri ọtụ nkịta.
Ụkwara nta (Tuberclosis n'olu bekee)
Ụkwara nta nke bekee kpọrọ Tuberclosis bụkwa ọrịa ọzọ ị nwerike ịnweta ma gị na anụmanụ nwee aramara.
Ụkwara nta bụ ọrịa na-emetụta ngụ mmadụ. Ọ na-eme ka ọtụtụ mmadụ na-akwa oke ụkwa nakwa ize uzere kwamgbe kwamgbe.
Dọkita Uche kwuru na ọ bụghị naanị site n'aramara anụmanụ na mmadụ ka e si nweta ọrịa ụkwara nta kama onye ahụ metụ anụmanụ aka o nwekwara ikew ibute ọrịa ahụ.
Mminwụ(HIV (human immunodeficiency virus)
Dọkịta Ngozi Joachin bụkwa dọkịta na-ahụ maka anụmanụ kọwara na ọrịa mminwụ bụ nke ndị sayensi kwuru na o si na enwe.
Ya bụ na mmadụ na enwe nwee aramara, onye ahụ ga-ebute ọrịa mminwu.
Ọria mminwụ na-etikpọ ime ahụ.
Syphilis
Dọkịta Ngozi Joachin kwuru na mmadụ nwerike ibute ọrịa Syphilis site n'ịdina ehi.
Syphilis bụ nje a na-ebute ma mmadụ maọbụ anụmanụ bu ya nwe mmekọrịta dịka dọkịta Joachin si kwuo.
Ọ na-esi n'agba fere agba.









