Nkịta karịrị 50 nwaanyị na-azụ ewerela ya mere nri n'Abakpa Nike dị n'Enugwu

Nkịta

Ebe foto si, Getty Images

Njinji jiri na Abakpa nike dị n'Enugwu oge otu nwaanyị gbara afọ 75 aha ya bụ Ada Young lara mmụọ n'ihi na e chere na nkịta karịrị 50 ọ na-azụ n'ụlọ ya eriela ya ma rachaa ọnụ.

Ya bụ ihe ịgba anya mmiri mere na mkpụrụ ụbọchị ole ma ole gara aga.

Dika BBC siri chọpụta, nwaanyị ahụ nwere ụlọ n'Abakpa enweghị di nke ọ na-enwe nwa ọbụla.

Ndị tenanti bi n'ụlọ ya kwuru na nwaanyị nwụrụ anwụ bụ Ada Young enweghị enyi nke ọ ma enwe onye ọbụla na-aba n'ụlọ ya.

Ụlọ ebe nwaanyị nwere nkịta 50 bi

Otu onye na-azụ ahịa eletrọnik n'ala ụlọ nwaanyị ahụ Buchi Michael kọwara na ọgbagwojuru ya anya ka ụmụ nkịta ahụ siri gbuo "land lady" ya n'ihi na ọ na-amụ nkịta ndị ahụ ụmụ ya.

Michael kọọrọ anyi na ọtụtụ mgbe ka nkịta na-ata ya bụ nwaanyị mana ọ naghị akọsara mmadụ ihe mere ya.

Ụbọchi ahụ mkpa mkpa kpara bụ na ihe karịrị shọp 30 nọ na-ala ụlọ ya kwuru na onwere ihe ma-esi na ụlọ ahụ, tinyekwara na ha ahụbeghị land lady ha ka mgbe week abụọ.

Onye agbata obi nwaanyị ahụ

Nkea mere ha na ndị agbata obi ha jiri ga ikwu nne nwaanyi ahụ nụ Mile Enugwu kpọta ndị obodo ha ka akụwaa ya bụ ụlọ.

Ọtụtụ ndị agbataobi kwuru na ọbụzị ka akụwara ụlọ ka ahụrụ ozu nwaanyị ahụ ka ụmụ nkita ahụ na-eri ya.

Ka ọ dị ugbua, ndị Nike eburula ihe fọrọ n'ozu nwaanyị ahụ, nke ekwuru na ọbụ sọsọ isi ya fọrọ were laba na be ha.

Anyị ka na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ ndị uweojii gbasara ya bụ akụkọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: