Coronavirus cure - Ihe ndị ị kwesịrị ịmata tupu ịṅụọ ọgwụ chloroquine

Mkpụrụọgwụ

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Tupu ị ga zụrụ ọgwụ chloroquine ṅụwa maka ọrịa coronavirus, lekwa ihe ikwesiri ịma ka ị ghara ịkwa m gara mara.

Chloroquine abụghị anụ oriri nwata ji egwuri egwu, ya mere kpachapụ anya.

Ọ bụ eziokwu na ụlọọrụ 'Food and Drug Administration' nke mba Amerịka enyela ikike ka a malite inye ndị nwere coronavirus chloroquine.'

Ọ bụkwa eziokwu na ụlọọrụ 'National Agency for Food and Drug Administration and Control' nke Naịjirịa amalitela itule ọgwụ a, mana ọ pụtaghị na onye ọbụla nwere ịga zụrụ ya ṅụwa.

Ihe ọghọm dị na chloroquine

Aha onyonyo, Chloroquine ọ na-agwọ ọrịa Coronavirus?

Cheta na a machiri chloroquine maka iji ya agwọ ọrịa malaria na Naịjirịa.

Cholroquine bụ oke ọgwụ nwere ike imebi ihe n'ahụ mmadụ ma ọ bụrụ na onye ahụ akpachaghị anya.

Chloroquine nwere ike ịkpata ihe ndịa:

  • Ọnyụnyụ na ọgbụgbọ
  • Ịgba ọbara n'ebe dị icheiche n'ahụ gị (bleeding)
  • Ichi ntị
  • Anaghị ahụcha ụzọ nke ọma (blurred vision)
  • Ndapụ ntutu isi (hair loss)
  • Ihe ọdịdọ (seizures)
  • Oke ike ọgwụgwụ
  • Nchagharị anụ ahụ, dgz.

Ihe dọkịta gị kwesịrị ịma tupu o nye gị chloroquine

Ọ bụrụ na ọ dị nnọọ mkpa na ị ga-aṅụrịrị ọgwụ chloroquine, gbaa mbọ mee ka dọkịta gị mara ihe ndị a tupu ọ sị gị ṅụọ maọbụ aṅụla:

  • I nwere ọrịa obi, ọrịa akịrị (kidney) maọbụ ọrịa umeju
  • I nwere ọrịa ntị maọbụ anya
  • Ị na-enwe ihe ọdịdọ
  • I nwere ọrịa afọ
  • O nwere etu ọgwụ ụfọdụ si eme gị n'ahụ, ịma atụ, ọgwụ a na-akọ gị ọkọ
  • Ị ṅụọla mmanya na-aba n'anya tupu ịbịa ụlọọgwụ
  • Ị dị ime maọbụ ị na-enye nwa ọhụrụ ara (maka ụmụ nwaanyị). Ọgwụ a nwere ike imebi ihe n'ahụ nwa ọhụrụ ahụ

Chloroquine a na-agwọ coronavirus?

Chloroquine

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Chloroquine

Ọgwụ 'chloroquine' abụrụla ahịa iwu ugbua n'ihi akụkọ na ya bụ ọrịa na-agwọ coronavirus.

Na mgbede ụbọchị Tọzde, onyeisiala mba Amerịka kwuru na ngalaba 'Food and Drug Administration' enyela nkwado ka e were 'chloroquine' na-agwọ ndị nwere coronavirus.

O kwuru na nnyocha gosiri na ọgwụ ahụ rụrụ ọrụ n'ahụ ndị e nyere ya.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ọtụtụ ndị kwukwara n'onyonyoo TV na na ụfọdụ ndị bu coronavirus ṅụrụ 'chloroquine' ma dị mma.

Mana ụlọọrụ FDA wepụtara akwụkwọ ozi wee kwuo na ha enyeghị nkwado ọbụla maka iji ọgwụ ọbụla agwọ coronavirus.

Ha kwuru sị: "Onwebeghi ọgwụ maọbụ ọgwụgwọ ọbụla anyị kwadoro maka ịgwọ coronavirus."

"Mana anyị nwere usoro ọgwụgwọ dị icheiche anyị kwadoro maka iji eleta ndị ọrịa."

Gịnị bụ chloroquine

Anwụnta

Ebe foto si, Science Photo Library

Nkọwa foto, Chloroquine bụ ọrịa e jibu agwọ malarịa nke anwụ nta na-akpata

Chloroquine bụ ọgwụ ejibu agwọ ọrịa ịba nke Bekee kpọrọ Malaria.

Mana e mechara otu ahụike mbaụwa bụ 'World Health Organisation' kwuo na ọ naghịzi arụ ọrụ ịgwọ ịba.

Ya mere e ji machie ya na Naịjirịa maka ndị nwere 'malaria'.

Ihe e ji mara chloroquine

Nwaanyị na-akọ ụkọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Chloroquine na-akọ ọtụtụ mmadụ ọkọ

Otu ihe e ji mara chloroquine bụ na ọ na-akọ ọkọ.

Mana ọbụghị mmadụ niile ka ọ na-akọ ọkọ.

Ndị ọkacha mara kwukwara na ọgwụ ahụ na-enye nsogbu n'anya ma mmadụ ṅụtee ya aka.

Ọ na-atakwa afọ, na-ebu ajụ, na-asa afọ, na-awa isi, na-afụkwa ụfụ n'ọkpụkpụ.

Mana ọbụghị mmadụ niile ka ihe ndị a ga-eme.

Etu e si aṅụ chloroquine

Dọkịta na-ede ihe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Aṅụkwala ọgwụ na-abụghị dọkịta sị gị ṅụọ

Ndị ọkacha mara kwuru na ọdịghị mma ịga zụrụ choloroquine na-aṅụ.

Ọ ga-abụrịrị dọkịta nyere gwara gị zụta ya bụ ọgwụ tupu ịṅụwa ya.

Ọbụghị naanị chloroquine, ọdịghị mma ịga zụrụ ọgwụ ṅụwa na-ebughị ụzọ gaa ka dọkịta nyochaa gi ahụ, mata ihe na-arịa gị, ma mara ọgwụ ọ ga-enye gị.

Ọ bụrụ na i so na ndị gbaara ga zụrụ chloroquine, wepụkwa aka enwe n'ofe.

Ọgbakọ ndị Ụka Katọlik

Onyeisi Ụka Katọlik na Legọs bụ Achịbishọp Adewale Martins enyela ndị ụkọchụkwụ na Legọs ntụziaka ka ha na-edo ofufe nro naanị mmadụ iri ise nọ na ya.

O nyekwara ndị ahụ adịghị, ụmụnwaanyị di ime, ndị ahụ adịghị ikike ịhapụ ịga ụka ụbọchị ruo otu ọnwa.

N'akwụkwọ ozi o wepụtara, Adewale gwara ndị ukọchukwu ka ha nye ndị ọrụ akụike ohere n'ụlọụka ikụziri ndị mmadụ etu ha ga-esi chekwa ọnwa ha .

Ọ gara n'ihu tụọ arịrị na na gọọmentị etinyeghị uchu na ichekwa agbata Naijiria na ndị mba ọzọ nakwa ihe gbara ụgbọ nje ọha iji gbochie nkesa ọrịa ọjọ.

Nke a na-eme dịka gọọmenti Lagọs nyere ndị ụka ndụmọd ikwusị ọgbakọ ha iji gbochie nkesa Coronavirus.

WAEC akwụsịtụla nhazi ule ha

Ụmụakwụkwọ na-ele ule Jamb

Ebe foto si, Jamb/webste

Ụlọọrụ ule bụ West African Examination Council (WAEC) asịla ụmụakwụkwọ Sekọndịrị ka ha cheretu n'ule ha na-akwado ile n'ọnwa Mee-Juun.

Nke a bụ n'ihi ọrịa coronavirus na-arị ibe ya elu n'Afrịka nakwa ụwa niile gbaa gburu gburu ka akwụsịtụ nhazi ule a.

N'akwụkwọ ozi odeakwụkwọ ha bụ E. K Myers wepụtara, ọ sị na nke a ga-adị ruo mgbe coronavirus belatara na mpaghara ndị a.

Cheta na ụmụakwụkwọ sekọndịrị na-ele ule a n'ọnwa Mee ruo Juun nke afọ ọbụla iji pụta n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị.

Ichekwa Naịjirịa site na coronavirus kachasị m mkpa - Buhari

Onyeisiala Muhammadu Buhari

Ebe foto si, @MBuhari

Onyeisiala Buhari ekwuola na ichekwa ndị Naịjirịa site n'ọrịa coronavirus bụ mbọ kachasị mkpa ọchịchị ya na-agba ugbua.

O kwuru nke a n'akara twitter ya dịka ọtụtụ ụmụ Naịjirịa katọrọ etu o si gbaa nkịtị kamgbe ọrịa batara Naịjirịa.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Buhari sị na o kwenyesiri ike na ndị ọrụ ahụike dị iche iche nọ n'ọchịchị ya nakwa ndị ọrụ ọtawaike banyere coronavirus o hiwere na nso nso a.

Akụkọ ọhụrụ banyere coronavirus na Naịjirịa

Osagie Ehanire minista ahụike na Naịjirịa

Mịnịstrị ahụike na Naịjirịa sị na ha na-eme nnyocha ịchọpụta etu otu onye Naịjirịa na-emebeghi njem n'ime ọnwa abụọ si bute ọrịa coronavirus.

Mịnịsta ahụike bụ Osagie Ehanire sị na Naịjirịa etinyela mba Austria na Sweden na mba ndị ha machiri maka ọrịa a.

Ehanire sị na mmadụ iri na otu ahụ bu ya na Naịjirịa bụ ndị si na mba ofesi bata nakwa na ọ bụghị na Legọs ka e kwuru maka ya.

O kwuru na mmechi e mechiri ọdọụgbọelu atọ (Enugwu, Pọtakọt na Kano) na Naịjirịa bụ iji kee nkwụcha banyere ọrịa a.

WHO asịghị ka a ṅụọ Chloroquine maka mgbochi coronavirus

Ụlọọrụ na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naịjirịa bụ Nigeria Centre for Disease Control ekwuola na ụlọahụike mbaụwa bụ World Health Organisation akwadobeghị ka a ṅụọ ọgwụ chloroquine maka mgbochi coronavirus.

Ha depụtara nke a n'akara twitter ha dịka ọtụtụ ndị mmadụ malitere itule ọkwa maka akụkọ si mba Amerịka pụta.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

'Coronavirus' egbuola Aurlus Mabele onye Kongo na-eti egwu na Fransị

Aurlus Mabele

Ebe foto si, Youtube

Nwafọ Kongo na-eti egwu bụ Aurlus Mabele anwụọla n'ụlọọgwụ dị na Paris isi obodo Fransị dịka ọ gbara afọ iri isii na asaa.

Akụkọ na-efegharị na soshal midia sị na ọ bụ coronavirus gburu ya mana a chọpụtaghị ma ọ bụ eziokwu.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Coronavirus In Nigeria: Gọvanọ Abia efughị efu nke o ji atọ atọ n'Amerịka - Ọnụ na-ekwuchitere Ikpeazu

Okezie Ikpeazu

Ebe foto si, John Okiyi

Ọnụ na-ekwuru gọọmenti Abia steeti bụ Onyebuchi Ememanka ekwuola na okwu na-efegharị na gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu furu efu maọbụ tọrọ atọ na mba Amerịka bụ okpotokpo asị.

Mgbe BBC Igbo gwara ya na ha chọrọ inụ olu gọvanọ Ikpeazu, o kwuru na ọ ga -agwa ụwa okwu gbasara etu steeti ahụ si eme ihe niile ha nwere ike imee iji hụ na ha busoro ọrịa coronavirus agha.

N'okwu ya, gọvanọ Ikpeazu nọ na Naịjirịa, ọ nọghị na mba Amerịka.

California akpọchiela kpam kpam

California

Ebe foto si, AaronP/Bauer-Griffin

Steeti California akpọchiela kpam kpam dịka ndị ọchịchị na-agbalị igbochi mgbasa ọrịa coronavirus.

California bụ steeti kachasị na mba Amerịka

Mmadụ 14,000 ebutela coronavirus n'Amerịka. 900 n'ime ha bụ ndị California.

Na Saụt Afrịka

Beitbridge bụ okeala Saụt Afrịka na Zimbabwe

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Beitbridge bụ okeala Saụt Afrịka na Zimbabwe

Gọọmentị mba Saut Afrịka ekwuola na ha ga-arụ ogige n'oke ala ha na mba Zimbabwe.

Nke a bụ iji gbochie ndị bu ọrịa coronavirus na ndị mbịarambịara ekwesịghị ekwesị ịbata na mba ha.

Mikel Obi

Mikel Obi

Ebe foto si, Getty Images

Mikel Obi ekwuola na ya agaghị alaghachi otu egwuregwu bọọlụ Trabzonspor ọzọ.

Obi adịghị Mikel mma etu Trabzonspor si kpaso ya agwa maka na o kwuru ka akwụsị asọmpi bọọlụ n'ihi coronavirus.

Ugbua Mikel alaghachila mba Ịngland ebe ya na ezinụlọ ya bi.