JAMB UTME: Etu Jamb ji nwụchie ndị 'gbara mgbọ' n'ule

Ụmụakwụkwọ na-ele ule Jamb

Ebe foto si, Jamb/webste

Ụlọọrụ na-ahụ maka ule eji aba mahadum bụ JAMB ewepụtala aha ọgbọ ule dị 76 bụ ndị ha sị mere nrụrụaka n'ụle ha nke afọ a.

Ha kpọpụtara aha ọgbọ ule ndị a dịka ha nyere onye ọkaikpe ikike ikpe ụmụakwụkwọ ruru otu narị so mee nrụrụaka n'ule elere n'etiti ụbọchị iri na otu na iri na asatọ nke ọnwa Eprelụ ikpe.

Onye na-ahụ maka ndebanye aha n'ụlọọrụ ahụ bụ Is-haq Oloyede kwuru nke a na Fraịde n'ọgbakọ agụmakwụkwọ nke afọ a emere n'Abuja.

Ụlọọrụ JAMB kwuru na ndị ọrụ nchekwa 'Civil Defence' na ndị uweojii nwuchiri ihe ruru mmadụ otu narị na Naịjirịa gbaa gburugburu n'oge ule a.

Oloyede kọwara na ọ bụ site n'ihe onyonyo CCTV ka eji chọpụta ndị mere nrụrụaka n'ụfọdụ ọgbọ ule a.

Ndị na-ede ule

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ule Jamb ejidela ọtụtụ ndị mmadụ rue ọtụtụ afọ tupu ha abanye mahadum

O kwuru na ụfọdụ ndị bịara ilere ndị mmadụ ule zoro n'ime ụlọ mposi ma pụta nọchie anya ụfọdụ ndị ha bịara ilere ule a dịka ha gara ime mposi.

Oloyede kwuru na ihe karịrị mmadụ otu narị nọ n'ime ụlọ mkpọrọ dị iche iche na Naịjirịa ugbua na-eche mgbe a ga-ekpe ha ikpe.

O kwuru na ọgbọ ule 76 ewepụtara aha ha so n'ime ọgbọ ule dị 741 ndị tinyere aha ha maka ule JAMB nke afọ a.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: