Computer village: 'Itinye 'Iyalọja' na 'Computer village' bụ iji kpachapụ Ndigbo'
Obi adịghị ụmụafọ na-azụ ahịa na 'Computer Village', Legọs mma n'ihi ntinye e tinyere ezeahịa nwoke na nwaanyị nke a kpọrọ 'Babalọja na 'Iyaloja' n'asụsụ Yoroba n'ahịa ahụ.
Onye odeakwụkwọ otu jikọtara ndị na-ere akụrụngwa kọmputa n'ahịa ahụ bụ Jerry Mba gwara BBC na atụmatụ inye ha 'Iyalọja' bụ ụzọ ndị Yoruba chọrọ iji akpachapụ Ndigbo ịbụ ndị isi na Computer Village.
O kwuru na ndị a ji akụkọ ụgha gbasara Ndigbo ga kọọrọ onyeisi ndị Iyaloja bụ Folashade Tinubu-Ojo.
Mba kwuru na ha gara kọọrọ ya etu ihe si eme n'akụkụ nke ha ebe Tinubu-Ojo kwere ha nkwa na ọ ga-akpọ ha oku, iji gbo nsogbu dị n'etiti ndị ahịa na ndị e chiri 'Iyaloja' na 'Babaloja.'
Mgbe BBC Igbo gara ebe ahụ ụbọchị Fraide, ndị ahịa Computer Village na-azụ ahịa ha na enweghị nsogbu ọbụla n'agbanye akụkọ na e tinyela Iyaloja na Babaloja na agbanyeghị na ha achọghị ya..
Cheta na n'agbanyeghị ngagharịiwe ndị ahịa 'Compụter Village' mere ụbọchị Tuzde, onyeisi ahịa na Legọs bụ Folashade Tinubu-Ojo tinyere 'Babalọja' na 'Iyalọja' n'ahịa 'Compụter Village..'
Tinubu-Ojo tinyere Adeniyi Lasoji na Abisola Azeez n'ọkwa ndị ahụ n'emume ha mere na Legọs ụbọchị Tọsde.
Cheta na ndị ahịa cọmpụter Village pụtara n'igwe mere ngagharịiwe na-ekwu na ha achọghị eze ahịa ọhụrụ na ọ bụghị nnu na ose ka ha na-ere na ọ bụ akụrụngwa teknụzụ.

Ebe foto si, Getty Images
Mana Tinubu-Ojo sara ha sị na ya nwere ikike itinye ezeahịa n'ahịa masịrị ya nke gụnyere 'Computer Village.'











