World Press Freedom day: 'Ndị ntaakụkọ chọkwuru ego nke ha'

Ebe foto si, Getty Images
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
E mee nwata ihe emere ibe ya obi adị ya mma.
Ọ bụ okwu a ka ndị ntaakụkọ sonyere na mkparịtaụka "BBC news Igbo" mere n'elu soshal midia n'ụbọchị mmemme nwereonwe ndị ntaakụkọ na mbaụwa niile kpụ n'ọnụ.
Mmadụ abụọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ Clara Okoro bụ onyeisi Brand World Media nakwa Emeka Madunagu bụkwa onye rụburu New Telegraph ọrụ dịka onye ntaakụkọ.
Ha gbadoro ukwu n'isiokwu atọ.

Ebe foto si, Getty Images
Nke mbụ bụ okwu ha na-agwa gọọmenti gbasara ịmapụta ego maka ịkwado ndị ntaakụkọ n'ụzọ pụrụ iche.
Ha nyere ndị Naịjirịa ndụmọdụ na ha na-enyocha ozi ọbụla ha na-ahụrụ maọbụ nụ maka ya.

Ebe foto si, Getty Images
Ndụmodụ ha nyesi ndị ntaakụkọ niile bụ ka ha kwudo n'eziokwu makana ọ bụ ndụ.





