Ị chọrọ ịma etu e si esi ojoko awayị? Lee ya ebe a

Ojoko awayị
Nkọwa foto, Ojoko awayị bụ ezi nri na-adị nwata, okenye nakwa ndị na-arịa ọrịa tara nchara mma n'ahụ

Ọtụtụ ndị mmadụ na-enwe mmasị iri ojoko chara acha, mana ha amaghị na ojoko achaghị acha bụ ebe ejedebere ma ọ bụrụ ma e sie ya ọfụma.

Ojoko 'abịrịka' maọbụ 'ogede' achaghị acha bụ ezi nri na-edozi ahụ.

Dịka ndị ọkachamara n'ihe gbasara nri na ihe ha na-enye n'ahụ siri kọwa, ojoko na-enye ọbara, potassuim, fibre na Vitamin dị icheiche.

Ngwa eji ezi ojoko awayị

1. Ojoko achaghị acha (aka anọ)

Ojoko
Nkọwa foto, Ojoko achaghị nwere 'fibre' nke na-enyere nje na-egweri nri n'afọ aka ịrụ ọrụ ya nke ọma

2. Azụ ọkpọ (otu maọbụ abụọ)

Azụ ọkpọ

3. Ụgụ

Ụgụ

4. Mmanụ (ngazi ofe abụọ)

Mmanụ nri

5. Ịsha (otu iko mmiriaraehi)

Ojoko

6. Ose (mkpụrụ ose iri)

Ose

7. Ogiri Igbo maọbụ ogiri bekee maọbụ ha abụọ (otu obere ngazi/ otu mpekere)

8. Yabasị (otu maọbụ abụọ)

Yabasị

9. Nnu

Nnu

Etu ị ga-esi sie ya

  • Were mmiri ọkụ saa azụ ọkpọ ahụ, wepụ ọkpụkpụ niile dị na ya ma tinye n'ime ite dị ọcha.
  • Mecha ojoko ahụ ma bee ya kịrị kịrị , saa ya mmiri ma tinye ya n'ime ite ahụ itinyerela azụ
  • Gwerie ịsha, ose, yabasị na ogiri ma tinye ha n'ite ahụ
  • Tinye mmanụ, nnu na ogiri bekee (ma ị chọọ)
  • Gbanye nwa mmiri n'ite ahụ. E kwela ka mmiri karịa ojoko ahụ
  • Donye ite gị n'oku ma sie ya ihe ruru nkeji iri na ise.
  • Tinye akwụkwọ nri i biri ebi
  • Gbaghaa ya bụ nri ma fọtuo ite gi ozigbo!

O ghela! Weta efere na ngazi gị

Ojoko awayị