Ernest Ezeajughi, bụbu 'Mayor' na London aghọọla "Chief of Staff" Soludo

Aha onyonyo, Ernest Ezeajughi: Etum si bụrụ Mayor na London.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ernest Ezeajughi bụbu "Mayor na London" esorola ọchịchị Anambra steeti dịka onye nchịkọta ndị ọrụ oyibo a kpọrọ "Chief of Staff" na Bekee.

Ezeajughi so na mmadụ atọ ndị ọzọ Gọvanọ Soludo kpọpụtara ụnyaahụ bụ Mọnde dịka ndị ga-enyere ya aka n'ọrụ.

Ndị ọzọ bụ Richard Nwora Madiebo bụ onyeisioche ịchụ nta ego a kpọrọ Anambra State Internal Revenue Service.

Onye nke atọ bụru AVM Ben Chiobi bụ onye ndụmọdụ Gọvanọ n'ọrụ nchekwa.

Ihe ndị ọzọ i kwesiri ịma gbasara Ernest Ezeajughị

Ernest Ezeajughi, bụbu 'Mayor' na London agba nke abụọ ya

Ji awayị tọọ ụtọ, awanye kwuo ya ji! Otu nwa afọ Igbo ji eje mba bụ Ernest Ezeajughị abụrụla 'Mayor' nke Brent dị na mba Briten agba nke abụọ ya.

Ernest Ezeajụghị nwetaburu ọkwa ahụ nke mbụ ya n'ụbọchị nke mbụ nke ọnwa May afọ 2019 na Brent Civic Centre.

N'ozi ekele nke Willie Obiano bụ gọvanọ Anambra steeti wepụtara, O kwuru na ihe Ezeajughị mere gosiri na 'Anambara steeti bụ ''ihe nke ala Naijiria" n'ezie.

Ozi ahụ nke Kọmishọna mgbasaozi steeti ahụ Don Adinuba binyere aka, Ọ sị "nhọpụta a họpụtagharịrị Ezeajughi bụ ihe akaebe na ọ rụrụ ndị Brent ezi ọrụ n'agba mbụ ya."

Onye Ọgbụ n'Anambara steeti, Ernest Ezeajughị gara mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Ọka Anambara steeti tupu ọ gawa ala Bekee ga biri.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ezeajughi kwuru na ọ bụ nna ya gwara ya ka ọ sonye na ndọrọndọrọ ọchịchị n'ime obodo ma kwe nkwa na ọ ga-atụkọta ego iji nyere ndị na-arụ ọrụ n'efu.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ọ ga-achị site n'afọ 2019 ruo afọ 2020.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ma ọ ka na-akwalite ọkọlọtọ Naịjirịa elu ebe ọ nọ.

Ezeajughi

Ebe foto si, @cllr.ernest.ezeajughi

Ihe ise ị na-amaghị maka Ezeajụghị (Mayor Igbo ndị Brent)

  • A mụrụ ya na Naịjirịa, n'Anambra steeti
  • Ọ gara Aguata High School Ekwulobia
  • Ọ gụrụ Sayensị na Mahadum Nnamdi Azikwe dị n'Anambra steeti
  • Ọ batara mba UK n'afọ 2004
  • A họpụtaburu ya dịka onyeisi ndị 'Stonebridge Ward' n'afọ 2014, ma weghachite ya n'afọ 2018
  • Ọ lụọla nwaanyị ma jide ụmụ anọ

Mana dịka a na-enwe anụrị maka ọkwa ọhụrụ Ezeajughi wetere, n'okwu ọzọ ihu gbaruru agbaru.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

Nwaanyị mba Naịjirịa bụ Fiona Onasanya abụrụla onye mbụ a ga-eji akwụkwọ ngosi iwe akpọrọ "recall petition" wepụkwa ya n'oche dịka onye omeiwu na-anọchite anya Peterborough.

A kpọchịrị Onasanya onye dị afọ iri atọ na ise na nga n'ọnwa January 2019 maka itụ asị gbasara ịgba oke ọsọ n'ịnya ụgbọala.

Ọ bụ onye mbụ na-enweta akwụkwọ ngosi mkpesa na mba England.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: