Chukwuma Soludo News: Charlie nwa Mgbaafọ emeriela ntuliaka Anambra

Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo emeriela ntuliaka Anambra dịka Gọvanọ

Ebe foto si, Soludo/Facebook

Nkọwa foto, Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo emeriela ntuliaka Anambra dịka Gọvanọ

Ogoogo

Mpụtara ntụliaka Anambra

Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo ji ọkọlọtọ All Progressive Grand Alliance a na-akpọ Apga emeriela ntuliaka ịbụ gọvanọ Anambra dịka mpụtara ntuliaka gbara n'ụbọchị Wenezde Novemba 10, 2021.

Soludo kacha nwe vootu na mmadụ 18 ndị soro zọ ọkwa gọvanọ Anambra steeti.

Ọkammụta Florence Obi (bụ returning officer) ndị nhazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission bụ Inec n'ichafu kpọpụtara ya dịka onye mmeri.

Ọkammụta Soludo chịtara vootu 112,229 n'ime vootu 249,631 niile a tụrụ n'Anambra.

Aha onyonyo, Ihe ị kwesịrị ịma maka Charles Soludo, gọvanọ ọhụrụ nke Anambra steeti

Onye sotere ya na ntuliaka e mere n'Anambra bụ Maazị Valentine Ozigbo chịtara vootu 53,807 n'ime vootu a tụrụ n'Anambra steeti.

Ị ma maka Valentine Ozigbo bụ na-azọ ọkwa gọvanọ Anambra steetị n’aha PDP?
Nkọwa foto, Valentine Ozigbo
Aha onyonyo, Anambra Elections 2021: Ihe mere ntụliaka Anambra ji e me n'afọ dị iche karịa ndị ọzọ

Ọ ga-eru Maachị 2022 tupu ọkammụta Chukwuma Charles Soludo ga-aṅụ iyi ọrụ tupu ọ chịwa Anambra dịka gọvanọ.

Ndị otu pati All Progressives Congress (APC) nọ n'ụlọọrụ Inec ebe a kpọpụtara mpụtara ntuliaka ebinyeghị aka n'akwụkwọ e ji ekweta maka mpụtara ntuliaka.

Mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti
Nkọwa foto, Anambra Election Inec Result Update: APGA emeriwala na 4 n'ime okpuruọchịchị 21 n'Anambra

Ụbọchị e kwesiburu ịkpọpụta mpụtara ntuliaka gbanwere

Cheta na n'ụbọchị Sọnde 7 Nọvemba, 2022 ka ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naijiria bụ Independent National Electoral Commission (Inec) akpọpụtaghizi onye ga-achị Anambra dịka gọvanọ n'ụbọchị kaa ọha si chee.

'Returning officer' nke Inec n'okwu ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra bụ Ọkamụta Florence Obi n'abali Sọnde kwuru na Inec emeghi mkpebi maka onye mmeriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra dịka ọha nọ chere mpụtara ntuliaka ruo ime abalị ụbọchị ahụ.

Florence Obi kọwara na nke a bụ maka na emeghi ntuliaka n'otu okpuruọchịchị n'Anambra steeti n'ihi nsogbu ọgbaghara. Ya mere na n'ime okpuruọchịchị iri abụọ na otu bụ okpuruọchịchị Ihiala.

Inec ekwuola na dịka nke a mere na a ga-eme ntuliaka mgbakwunye bụ nke Beekee kpọrọ 'Supplimentary Election' ebe ahụ n'ụbọchị Tuzde 9 Novemba 2021.

Site n'okwu ndị ụlọorụ Inec, ihe gbochiri ntuliaka ebe abụ bụ okwu ajọ ụzọ nakwa okwu nsogbu ezi nchekwa.

Anambra election result live update: Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo ga-aṅụ iyi ọrụ ya na Maachị 17, 2021

Ebe foto si, Soludo/Facebook

Nkọwa foto, Anambra election result live update: Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo ga-aṅụ iyi ọrụ ya na Maachị 17, 2021

Gịnị kpatara na emeghi ntuliaka n'Ihiala?

Cheta na site n'akwụkwọ ndị ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka Naịjirịa bụ Inec bipụtara, ha sị na mmadụ 148,000 debanyere aha ha ịtụ vootu n'okpuruọchịchị Ihiala.

Ma na n'oge gara aga mgbe ndị na-azọ okwa gọvanọ mere achụmnta vootu n'Ihiala, ndị omekome mere nwakpoo ebe ahụ nke mere ndị ọrụ nchekwa ji memina mmadụ anọ n'ime ha.

Ndị na-achọ nwereonwe Biafra foro ntututaa sị na agaghị eme ntuliaka n'Anambra, mere ezigbo nsogbu nchekwa wee dịrị n'oge ahụ.

Ya mere n'ihi iji chekwa ndụ ha, ndị mmadụ apụtaghi ịtụ vootu ha.

Ajụjụ juru ndị mmadụ n'ọnụ ugbua bụ nke a ọ ga-emetụta onye ga-enwete mmeri na ntuliaka a ka ọ gaghi?

Dịka o si aga, Returning Officer ndị ụlọọrụ Inec bụ onye na-ewega mpụtara ntuliaka e mere kwupụtara na o nweghị ntuliaka e mere n'Ihiala n'ụbọchị 6 Nọvemba.

Cheta na ụlọọrụ Independent National Electoral Commission, INEC amalitela nchịkọta mpụtara ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti n'ogogo steeti n'ụtụtụ Sọnde 7 Nọvemba n'ụfọdụ mpaghara okpuruọchịchị Ihiala dịka a malitere ịchịkọta nke wọọdụ na okpuru ọchịchị n'ụbọchị Satọde.

Anambra Election Inec Result Update: APGA emeriwala na 4 n'ime okpuruọchịchị 21 n'Anambra
Nkọwa foto, Anambra Election Inec Result Update: APGA emeriwala na 4 n'ime okpuruọchịchị 21 n'Anambra

Nke a na-abịa dịka Inec dọtịkwuru oge ntuliaka ruo taa bụ Sọnde iji nye ndị igwe ndenye aha BVAS (nke Inec ji arụ ọrụ) ekweghi mee ntuliaka ụnyaahụ, ohere ịtụ vootu.

Dịka Inec si depụta, ihe ọ na-ewe iji kpọpụta mpụtara onye meriri na ntuliaka onyeisiala maọbụ nke gọvano bụ onye a kachasị tunyere vootu.

Ya a pụtara na onye ahụ ga-emeriri otu ụzọ n'ụzo anọ ndị niile a turu vootu n'ụzọ abụo n'ime ụzọ atọ nke steeti niile dị na Naịjirịa maọbụ okpuruọchịchị dị na steeti.

Gọvanọ ọhụrụ nke Anambra, Ọkammụta Charles Chukwuma Soludo

Ebe foto si, Soludo/Facebook

Nkọwa foto, Gọvanọ ọhụrụ nke Anambra, Ọkammụta Charles Chukwuma Soludo

Ebe a ka ị ga-ahụ mpụtara vootu niile a tụrụ n'Anambra steeti, nke Bekee kpọrọ "Anambra election update".

Nsogbu dapụtara n'Orumba Nọọtụ

Chief "returning officer" ndị Inec nke Orumba Noọtụ bụ dkt Michael Otu ekwuola na amanyere ya amanye ibianye aka n'akwụkwọ e ji agụkọ vootu.

Ọkammụta Florence Obi bụ 'electoral officer' nke Anambra gwara ya kọwatụ ihe merenụ.

O kwuru na ndị omekome nakwa ndị uweojii kụrụ ya na osote ya ihe tịnka kụrụ pan n'oge ntụliaka ahụ mere na Nov 7,2021.

Obi gwara ọkammụta Otu ka o gaa depụta mkpesa ahụ n'akwụkwọ.

Onye bụ Chukwuma Soludo?

Charles Chukwuma Soludo bụ onye Isuofia, n'okpuruọchịchị Agụata Anambra steeti. O tokwara n'Anambra steeti, ya mere ya na ndị ma ya ji akpọ ya 'ọkụkọ Igbo'.

Soludo dị afọ 61 na nwunye ya bụ Nonye Soludo, mụrụ ụmụ isii.

Ọ bụ onye nkuzi na mahadum tupu ọ bụrụ onyeisi ụlọọrụ Central Bank of Nigeria, site na 2004 ruo 2009.

Ọ bụghị mbụ ọ na-apụta ịzọ ọkwa gọvanọ dịka ọ nwara n'afọ 2010 n'okpuru otu patị ndọrọndọrọ People's Democratic Party a ma ka PDP, mana Peter Obi meriri ya.

Ọ nwakwara n'afọ 2013 n'okpuru APGA, mana ndị nnyocha otu pati ahụ kwuru na o tozughi.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: