Voter Apathy: Ihe mere ndi Anambra jiri kwesi ime ntuliaka

Aha onyonyo, Voter Apathy: Ihe mere ndi Anambra jiri kwesi ime ntuliaka

Onye ọbụla ma maka ntuliaka n'Anambara steeti ma na ndị mmadụ anaghị esonye karị na ntuliaka.

Dịka ngalaba na-ahụ maka ntuliaka bụ nke Bekee kpọrọ 'Independent National Election Commission' (Ịnec) siri gozi, o nweghi oge ndị tụrụ vootu n'Anambara na-agafe pasenti 25.

Ndị Ọkachamara na-atụ aka na ọ ga-abụ ụjọọ banyere nchekwa adịghị na-eme ka ndị mmadụ na-agbaghapụ isonye na ntuliaka.

Akụkọ a ga-egosi etu a ga-eji were mee ka ndị mmadụ ghọta ihe atụghị vootu nwereike bute.