Nsogbu nchekwa ndị chere ntuliaka Anambra aka mgba

- Onye dere ya, Jessica Nwankwo
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos
Anambra steeti bụ steeti akpụ n'ọnụ ugbua na Naịjirịa niile maka ihe abụọ: ntụliaka nakwa ọgbaghara.
N'izu ole na ole gara aga, ọnọdụ nchekwa n'Anambra jisike akawanye njọ dịka ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ jisike achụ nta vootu nke ha.
Rue ugbua, o nwebeghi ihe ngalaba na-ahazi ntụliaka bụ Inec kwuru maka ịbugharị ntụliaka ahụ ebe ụjọ ji ụfọdụ mmadụ ịpụta tụọ vootu.
Anambra na okwu nchekwa

Ebe foto si, Obi/Ngige/Obiano/Facebook
Nsogbu gbasara nchekwa abụghị okwu taa n'Anambra.
Kemgbe onye chịburu steeti ahụ mgbe amalitekwara ọchịchị onye kwuouche ya n'afọ 1999 bụ Chinwoke Mbadinuju nọ n'ọkwa, ọtụtụ ihe agaala.
N'ihi na e nwere ọtụtụ ahịa juru na steeti ahụ, ọ kachasị nke dị n'Ọnịcha, ndị ohi na-enye ndị ahịa ahụ nakwa ndị bi n'akụkụ ya nsogbu.
O butere otu dị icheiche gụnyere 'Oye boys', 'Omata' nke ndị mmadụ kpokọbara iji nyere onwe ha aka nakwa 'Operation Sweep' nke ndị uweojii.
Ya mekwara Mbadinuju si kpọọ ndị 'Bakassi Boys' si Aba, Abia steeti oku ka ha nyere aka chụpụ ndị ohi ahụ.
Mgbe oge ahụ gachara, n'ihe dịka afọ 2007 rue afọ 2010 ka ndị ntọ malitekwara ịnye ndị Anambra nsogbu site n'ịtọrọ ndị welitere isi n'ebe ahụ.
Peter Obi nọ n'ọchịchị mgbe ahụ nyere iwu na onye ntọ ọbụla ejidere na steeti ahụ a ga-akwatu ụlọ ọbụla ọ rụrụ nakwa gọọmentị ewerekwa ala ebe a rụrụ ụlọ ahụ.
Ọ bụghị naanị na Obi nyere iwu a, ọ gakwara n'ihu mezuo ya nke mere na ntọ kwụsịrị kpam kpam na steeti ahụ rue ugbua a na-ekwu okwu 'Unknown gunmen'.

Etu ọnọdụ nchekwa si chee Anambra aka mgba
Ọwụwa anywanwụ Naịjirịa banyere n'ọnọdụ nchekwa kemgbe ọnwa Febụwarị mgbe ndị oji egbe amaghị ndị ha bụ malitere ịwakpo ụlọọrụ ndị nchekwa n'ala Igbo.
Ha gbakara ụzọ ụlọmkpọrọ n'Owerre, wakpoo ụlọọrụ ndị uweojii n'Imo, Abia, Enugwu, Rivas, Delta, Anambra nakwa Ebonyi.

Ihe ọzọ ndị a mere bụkwa ịgba ụlọọrụ Inec ọkụ n'Ọka, Anambra steeti.
Na nsonso a ogbugu na-arị ibe ya elu n'Anambra dịka ndị ahụ na-ekwu na ntuliaka agaghị eme chaachaa n'Anambra.

Ebe foto si, INEC
Ebelechukwu Igboekunie Ngini bụ otu onye ndu ndị ntorọbịa n'Anambra steeti tinyere ọnụ n'okwu a.
N'uche ya "ụjọ ji ndị mmadụ ịpụta tụọ vootu na ntụliaka a na-akwado ịme maka akụkọ mwakpo na-efegharị ebe niile".
Ọ ga-eme ka ihe a kpọrọ 'Voter apathy' (bụ mgbe ndị tozuru ịtụ vootu jụrụ ịtụ ya) kawanye njọ.
Ihe enwereike ime iji belata maọbụ bie ya bụ okwu.

Ebe foto si, Ebelechukwu Ngini
Ngini kwuru na otu ihe e nwereike ịme iji hazie okwu nchekwa dịka ntụliaka na-abịa n'ihu bụ ịbụgharị ya bụ ntụliaka.
"Ọ bụru na a ga-abugharị ntụliaka a izuụka atọ maọbụ atọ , ọ ga-enye aka maka na ọ ga-egosi na a na-ege ndị ntọrọbịa na-akpa mkpamkpa a ntị"
Ihe ọzọ Mazi Ngini kwuru bụ ka akpọọ ndị ntorọbịa ahụ na-eme ihe a ma malite mkparịtaụka iji nye ha ihe ha chọrọ.
O ji otu 'Niger Delta Militants nyere mpaghara ha nsogbu nakwa etu gọọmentị si kwụsị ya site n'inwe mkparịtaụka.
Mana ụlọọrụ Inec na-ekwusi ike na ha agaghị ebugharị ntuliaka ahụ ehibere n'ụbọchị 6 nke ọnwa Nọvemba afọ 2021.
Gọọmentị etiti na-ekwukwa na ha nwereike ịtịnye ọnọdụ gbatagbata nke Bekee kpọrọ "State of Emergency" n'Anambra maka otu ihe ahụ.











