Abatete Attack: Unknown gunmen e gburu ndị uweojii atọ n'Abatete? Lee ihe anyị ma

BBC

Akụkọ n'ekwụ na ndị omekome gbagburu mmadu ise gụnyere ndị uweojii atọ ma tọrọ kwa otu onye na mpaghara Abatete dị n'Anambra Steetị n'ụbọchị Tuzde.

N'ime ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia, otu nwoke kwukwara na ndị omekome ahụ gbakwara ụgbọ ala atọ ọkụ na mwakpo ahụ.

O kwukwara na ya bụ onye atọrọ., ebụpuru ya buga ya ebe mmadụ amaghi.

Ndị nta akụkọ Nation kwuru na onye uweojii ukwu gwara ha na bụ ihe mere n'ezia mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikengia kwụrụ na ọnụbeghị maka mwakpo ahụ.

Ihe onye ntaakụkọ BBC huru mgbe ọ gara ebe ihe a mere

Anyị gbara otu onye sị na ọ nọ ọhụrụ mgbe ihe a mere ajụjụ ọnụ, mana akụkọ ọ wetere dị ịche na akụkọ nke anyi nwetere n'isi ututu taa.

N'okwu ya, ọ sị na ya bụ ndị o ji egbe ezụ achọghi ịwakpo mpaghara Abatete mana na ụgbọala ha mebiri n'etiti ụzọ ebe ahụ, ebe ha gbadatara chowa ịnapụ ndị mmadu ụgbọ ala ha n'ike.

N'akụkọ ya, ọ sị na otu nwoke a ma ama na mpaghara ahụ bụ Chief Udaala na ndị ọrụ nchekwa ya pụtara bụkwasiwa ya bụ ndị omekome agha.

N'iwe, ndị omekome ahụ gbanyere egbe n'ebe a na-agbanye mmanu ụgbọala, nke munyere ụgbọala ahụ ọkụ ma merukwa ndị ọrụ nchekwa nwoke ahụ ahụ.

O kwukwara na a tọghị nwoka ahụ nandị ọrụ nchekwa ya kama ebugara ha ụlọ ọgwụ nke anyi achọpụtabeghi ebe ọ nọ.

Ihe ndị uweojii Anambra steeti kwuru

Ụgbọala agbara ọkụ

Ebe foto si, BBC

Nkọwa foto, Ụgbọala agbara ọkụ

Tochukwu Ikenganya bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Anambra steeti kwuru na akụkọ etu mwakpo mere n'Eke Agu dị n'Abatete, Anambra steeti edochaghị anya.

O kwuru na ọ ga-agwa anyị mpụtara nyocha ha na-eme ugbua iji chọpụta ihe mere n'ebe ahụ kpọmkwem.

Aha onyonyo, Eeee awakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'obodo anyị ma gbuo inspector Peter - Onye Obodo Ojoto