South East Attacks: O nweghi ịbọ ọbọ anyị na-eme n'Ohafia - Ndịagha Naịjirịa

Ndịagha Naịjirịa na-enyocha ụgbọala

Ebe foto si, @Nigerian Army

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndịagha Naịjirịa ekwuola na o nweghi ozi ịbọ ọbọ ọbụla ha na-eme n'obodo Ohafia dị n'Abia Steetị.

Ọnụ na-ekwuru ha bụ Mohammed Yerima sị na akụkọ ahụ na-efegharị na ha na-abọ ọbọ n'obodo Elu, Amangwu na Amaekpu Ohafia maka ọnwụ ndị otu bụ asị.

Ọ sị na ọ bụ akụkọ a chọrọ iji katọọ ọrụ ọma na ugwu ndịagha nwere.

Yerima sị na ihe mere bụ na ndịagha gara ọrụ nzacha na mkpocha mpụ dịka usoro iwu nakwa ikike dịịrị onye si dị.

Ọ sị na ha mere nke iji a wetekwa udo na azụmaahịa n'obodo ahụ bụ nke ndị Ipob na ESN na-awakpo ụlọọrụ ndị uweojii lara n'iyi.

Ndịagha Naịjirịa

Ebe foto si, Nigerian Army

Ọ sị ha na ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na-arụkọ site n'ama ụfọdụ ndị obodo na-agbara ha iji weta udo.

Yerima gara n'ihu sị ndị Abia Steetị ka ha anọla n'ụjọ na ha ga-echekwa ndụ na akụnaụba ha.

Etu ndị oji egbe na ndịagha ji kpatara ndị Ohafia nkụ ahụhụ

Ụlọ ndị a gbara ọkụ

Ebe foto si, Abia Facts Newspaper

Akụkọ na-efegharị aghara aghara bụ etu ndị oji egbe na ndịagha si kwarịtaa egbe n'obodo Elu, Amangwu na Ebem dị cha n'Ohafia nke Abia Steetị.

N'ihi nke a, oke egwu ji zi ndị bi n'obodo ndị a nke mere na ọtụtụ hapụrụ ụlọ ha gbaa ọsọ izendụ.

Kedụ ka ihe a si mee?

Otu onye bi n'Ohafia na-achọghị ka a kpọọ aha ya kọọrọ BBC Igbo ihe ọ maara maka ọgbaghara a.

Ọ sị na ọ malitere kamgbe ndị oji egbe gbachara ụlọ otu nwoke bụ O.K Ugba e ji 'Isibumba' maara ọkụ n'obodo Amangwu, Ohafia sị na o tinyere ihe onyonyo o ji enyocha ha.

Mana nke ugbua bụ na ndị oji egbe bịara n'ụbọchị Tọsde tọọrọ Eze ndị obodo nke mere ndịagha ji na-achụ ha, ha malite ịkwarịta onwe ha egbe.

Aha onyonyo, Eeee awakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'obodo anyị ma gbuo inspector Peter - Onye Obodo Ojoto

Akụkọ ọzọ kwuru na ndị oji egbe a pụtara n'ọdọụgbọala dị n'Ebem Ohafia ma malite ịgba egbe aghara aghara.

Ụda egbe ahụ mere ka ndịagha nọ n'Ohafia ji chọrọ ndị oji egbe ahụ ha jiri malite ịkwakọrịta mgbọ dịka mgbọ tụrụ ụfọdụ ndịagha.

N'ihi nke ahụ ndị bi n'Ohafia na-eze isi onwe ha ugbua, ndị na-ere ahịa dị iche iche anaghi emepe kamgbe ahụ.

Kedụ ka Ohafia dị ugbua?

Ụgbọala a gbara ọkụ n'Ohafia

Ebe foto si, Abia Facts Newspaper

Onye a na-achọghị ka a kpọọ aha ya sị na Amangwu, Ebem na Elu Ohafia jizi ụjọ biri ugbua maka etu ndịagha si amaja ndị mmadụ kamgbe ihe a mere.

"Ndị na-azụa ahịa ndị achụntaego dị iche iche anaghị emepezi ụlọ ahịa n'ihi egwu maka na ọgbaghara ahụ butere ịla n'iyi ụfọdụ ụlọ na ngwaahịa ndị mmadụ".

Ụlọ na-ere ọkụ

Ebe foto si, Abia Facts Newspaper

Cheta n'ọnwa Eprelụ afọ 2021, ndị oji egbe wakporo ụlọọrụ ndị uweojii dị n'obodo Nkporo nke okpuruọchịchị Ohafia, gbaa ya ọkụ ma tọhapụ ndị e ji eji.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: