June 12 Protest: Ihe mere anyị ji chụsasia ndi na-eme ngaghariwe ụnyahụ- ndị uweojii

Ebe foto si, Nigeria Police Force Facebook/
Ndị uweojii nọ na Naịjirịa ekwuola na etu ha si jiri egbe ose anya chụsasia ndị na-eme ngagharaiwe iji mee ncheta ụbọchị nwereonwe Naịjirịa dị mma.
Frank Mba bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Naịjirịa kwuru na ya bụ atụmmatụ bụ nke sonyere usoro ndị mba ofesi ji achụsasị na-eme ngaghariwe n'ụwa niile.
Mba gwara ụlọọrụ mgbasaozi Channels nke a mgbe ha na-agba ya ajụjụ ọnụ n'onyonyo.
O kwuru na ihe mere ha ji gbaa tụmadị ndị na-eme ngagharaiwe n'Abuja bụ na ha malitere piakasiwa ihe .
Mana ndị ụlọọrụ Channels kwuru na onye ntaakụkọ ha gara isete etu ngaghariwe ndị e mere na Legos na Abuja si gaa, ahụghị ebe ndị na-eme ngaghariwe si apiakasị ihe ụnyahụ.
Etu ngaghariiwe June 12 si aga n'ala Igbo na ebe ndị ọzọ na Naịjirịa

Ebe foto si, BBC Yoruba
Ụnyahụ bụ ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Jun bụ ụbọchị eji echeta ọchichị onyekwuoucheya na Naijirịa n'afọ niile.
Ozi na-erute anyị ntị na-ekwu na ọtụtụ ndị pụtara na steeti di iche iche mee ngahariiwe maka etu ha sị n'ọnọdụ Naijirịa adịghị ha mma.
Lee ka o siri gaa -
Ebonyi Steeti
Onye ntaakụkọ anyị nọ ebonyi steeti gwara anyị na ebe niile deere duu.
Enweghị ihe ọbụla pụruiche dịka ndị mmadụ na-agara mkpa ha.
Ọ bụ na mpaghara obi gọọmentị ochie nke dị n'Udensi Ebonyi steeti ka esiri seta foto ndị a.

Ụlọ ahịa mpere dịka ndị mmadụ na-ere ma na-azụta kwa ihe ha chọrọ.


Na Legọs Steeti
Ndị uweojii bidoro ịchụsasị ndị na-eme ngaghariiwe na Legọs.
Ha nwụchiri ụfọdụ n'ime ndị ahụ pụtara ịme ngagharịiwe mana emechara tọghapụ ha.







Ụfọdụ ndị pụtara na Legọs steeti mee ngagharịiwe nke ha


N'isi Obodo Abuja
Ndị mmadụ pụtara ime ngaghariiwe ebe ndị ọzọ pụtakwara igosi nkwado ha ebe Onyeisiala Muhammadu Buhari nọ.


N'aka nke ọzọ, lee ndị pụtara ime ngaghariiwe ma kwado Onyeisiala Muhammadu Buhari

Ebe foto si, BBC Sport

N'Ondo steeti

Ọtụtụ ndị ntorọbịa pụtakwara ịme ngagharịiwe n'Ondo steeti
Ha bucha ọkọlọtọ gosiri iwe ha maka ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa.

Ha sikwa n'ebe dị icheiche were gbakọọ n'ebe akpọrọ "Oba Osupa Roundabout" n'isiobodo steeti ahụ bụ Akure.


N'Osun Steeti
Ndị mmadụ pụtara n'obodo Oshogbo nke dị n'Osun steeti were mee ngaghariiwe nke ha.

Ebe foto si, BBC Yoruba

Ebe foto si, BBC Yoruba
N'Imo steeti
Lee ka Owerri isi obodo Imo steeti dị taa -

Ebe niile deere juu dịka ndị mmadụ na-aga mkpa dịịrị ha.
Onye ntaakụko anyi nọ na steeti ahụ keuru na kọmishọna ndị uweojii gwara ya na Imo steeti nọn'ọnọdụ gbatagbata nke bụ na ndị nchekwa nereikike ịkwụsị ngaghariiwe ọbụla n'ike.

N'ime afọ abụọ, anyị akpọpụtala mmadụ nde iri na ụma site n'ụbịam pụta - Mohammadu Buhari

Ebe foto si, State House
Dịka Naijirịa na-eme emume Demcracy day a na-eme n'ụbọchị iri na abụọ nke ọbụla kwa afọ, Onyeisiala Naijirịa mere mgbasa ozi nke o jiri zie ndị mmadụ ozi emume ncheta ụbọchị a?
Lee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ o kwuru na ya bụ mgbasa ozi :
- Onyeisiala Buharị zịgara ezinụlọ ndị ọrụ nchekwa Naijirịa ya na ezinụlọ ndị ọgbahara riri isi ndị nke ha ozi iti aka n'obi.
- O kwuru sị, " N'ime afọ abụọ, ihe Naijirịa gabigara na-ememila obod ndị ọzọ kama kachasị ihe gbasara nchekwa".
- Buharị kwuru sị, "Ụmụ Naijirịa ibe m , oge ụnụ tinyere m n'ọchịchi n'afọ 2015 unu kwenyere na m nwereike ịkwụsị mwakpo ndị omekome na-awakpo na mpaghara ọwụwa anyanwụ ugwu. Kama dịka anyị na-achụsasị ha ebe ahụ, ha na-abata n'ime ala anyị. Ọ bụ ya bụ nsogbu chere anyị n'ihu ugbua. Kama site n'ike Chineke anyị ga-enwe mmeri n'ihe ndị a."
- Onyeisiala Buhari kwuru na mbọ gọọmentị na-agba imepe obodo gụnyere akwa Naija nke abụọ, okporo ụzọ Legọs- Ibadọn na nke jikọrọ Abuja, Zarịa, Kaduna na Kano.
- Ikike m, nyere ka gọọmentị na ụlọọrụnọorọ onwe rụọ ọdọ ụgbo mmiri nke Lekki Deep Sea port, Bonny Deep sea port, Ibom Deep sea port na Warri Deep sea port ga-eme ka ọrụ dị ma nye ohere ka ụlọọrụ si ofesi bata Naijirịa.
- N'ime afọ abụọ gara aga, anyị akpọpụtala mmadụ nde iri na ụma site n'ụbịam pụta.
- Anyị bu n'obi na nkwa ịkpọpụta mmadụ otu nde nari n'ụbịa pụta ga-emezu.
- Onyeisiala Muhammadu Buhari kelere ndị Naijirịa maka ndidi ha na mkpebi itiko aka ọnụ were hụ na ebum n'uche maka Naijirịa bịara na mmezụ.










