EndSARS Panel: Anyị ekweteghị na e nwere 'Massacare' na Lekki Toll Gate - 'Whitepaper' Gọọmentị Legọs

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị Legọs Steeti edepụtala akwụkwọ ozi ha jiri zaghachị mpụtara kọmịti gọọmentị hiwere iji nyochaa mpụtara kọmitị nyochara mkpamkpa kpara n'oge ngagharịiwe Endsars na steeti ahụ.
Ya bụ akwụkwọ ozi ha wepụtara na-akọwa na ọ bụghị eziokwu na e gburu imikiti ndị mmadụ na Lekki Toll Gate n'abalị 20/202020 dịka kọmiti nyochaburu ya bụ okwu siri kwuo.
Kama ha jụrụ otu kpamkpam ma sịkwa na ha ga-anabata isii ọzọ ma agbanwe ha.
Gọọmentị Legọs gara n'ihu kwuo na ntule iri na anọ ndị egosi adịghị ha n'aka ma sị na ọ bụ gọọmentị etiti ka ọ dịịrị itinye ya anya.
Kedụ nke bụ otu mpụtara gọọmentị Legọs jụrụ ịnabata?
Gọọmentị Legọs steeti jụrụ ịnabata mpụtara nyocha nke bu akara 24 bụ nke na-ekwu na egburu mmadụ itolu na Lekki Toll Gate.

Ebe foto si, Getty Images
Ha na-ekwu na ya bụ mpụtara enweghị isi ma kwuo na ọ bụ uche obi ndị mere ya bụ mpụtara.
Mpụtara iri na otu gọọmentị Legọs steeti nabatara
N'ime akwụkwọ ozi a gọọmentị Legọs steeti bipụtara ka na gụpụtara mpụtara iri na otu na nabatara.
Lee ha n'usoro akara ha -
Mpụtara akara 6 - Nke a na-ekwu na soshal Midia soro mee ka ngagharịiwe Endsars kawanye njọ ma rịọ ka ndị mmadụ na-agbasa naanị eziokwu.
Gọọmentị legọs steeti na-ekwu na ha ga-ebido ikụzirindị mmadụ maka soshal Midia na ọghọ dị na ya ma ọ bụrụ ịsọghị ya nke ọma.
Mpụtara akara 8 - Mpụtara a na-ekwu ka gọọmentị kwụọ ndị niile lekọtara ndị soro mee ngaghariiwe Endsars ụgwọ maka ọrụ ha oge ahụ.
Gọọmentị legọs steeti na-ekwu na ha akwụọla ụloọgwụ ndị a niile ụgwọ ha ma kelee ụloọgwụ Reddington n'ụzọ pụrụ iche maka etu ha siri lekọta ndị mmadụ n'efu oge ngagharịiwe Endsars.

Ebe foto si, Reuters
Mpụtara akara 10 - Nzụkọ mere nyọcha a kwuru ka gọọmentị hụ na ha lebara mkpesa ndị mmadụ anya nkeọma ma mee ya ngwangwa.
Gọọmentị Legọs steeti kwuru na ha nabatara ya bụ nutliaka ma kwuo na ha ga-agba mbọ hụ na ha na ndị ntoroọbịa na-akparịta nke ọma site n'atụmatụ
'Youth Peaceful Conflict Resolution programme' na mkparịta ụka ha na ndị uweojii.
Mpụtara akara 11 - Mpụtara na-ekwu ka gọọmentị hụ na ha na ndị ntoroọbịa na-enwe mkparịta ụka nkeọma.
Gọọmentị Legọs steeti kwenyere na ya bụ mpụtara ma sị na ha ga-etinye uchu na mkparịtaụka ha na ndị ntoroọbịa dịka ọ na-aga n'ihu ugbua.
Mpụtara akara 12 - Mpụtara a na-ekwu ka gọọmentị hụ na ha gbasara ozi gbasara iwu onye apụtala ezi nke ọma oge ọbụla ehiwere iwu a.
Gọọmentị Legọs steeti nabatara ya bụ ntuliaka.
Mpụtara akara 16 - Nzụkọ nyocha a kwuru ka gọọmentị hụ na ha nyere ndị ọrụ Lagos State Environmental Health Monitoring Unit (LASEHMU) ọzụzụ zuru oke.
Gọọmentị Legọs steeti nabatara nke a ma sị na ha ga-enye ndị ọrụ LASEHMU ọzụzọ zuru oke ma kwado kwa ha n'ụzọ ziri ezi.

Mpụtara akara 18 - Nzụkọ nyocha akwuru ka ahụ na echekwara ogige ebe mkpamkpa ọbụla mere ka ndị na-eme nyocha nwee ike mee nyocha ha nke ọma.
Gọọmentị Legọs steeti nabatara ya bụ ntụlịaka ma sị na ha ga-ezigara ya gọọmentị Naijirịa. ha kwukwara na ha ga-ehiwe ebe nyocha Forensic na nke DNA.
Mpụtara akara 20 - Mpụtara ọzọ bụ ka gọọmentị mee ka ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Oktoba afọ ọbụla bụrụ ụbọchị ndị na-akwọ ụgbọala agaghị atụ ụtọisi tollgate.
Legọs steeti nabatara ya ntuliaka ma sị na ọ dị mma maka udo na ịdị n'otu.
Mpụtara akara 23 - Nzụkọ a kwuru ka gọọmentị mee ihe niile ịjị hụ na ndị ntoroọbịa tụkwasịrị obi n'ebe gọọmentị nọ.
Gọọmentị nabatara ya ma sị na ha ebidola usoro a.
Mpụtara akara 31 - Mpụtara a na-ekwu ka ndị ụlọ omeiwu nke Legọs steeti hiwe ngalaba na-ahụ maka ikike dịịrị onye ọkachasị nke gbasara ndị uweojii na ndị nchekwa ọzọ.
Gọọmentị Legọs steeti kwetara ime nke a.
Mpụtara akara 32 - Nzụkọ nyocha a kwuru ka gọọmentị legọs steeti wegara ngalaba Human Rights Committee site na ngalaba na-ahụ maka ikpe ziri ezi.
Gọọmentị Legọs steeti kwetara na nke a.
Ihe Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi na Naijirịa nwere ikwu maka mpụtara nnyocha Endsars

Ebe foto si, Lai Mohammed
Minister mgbasaozi bụ Laị Mohammed ekwusiela ike na gọọmentị ka kwụ n'okwu ha nke sị na "onweghi onye ọbụla e gburu na Lekki Toll Gate" n'oge ngagharịiwe EndSARS.
O kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajuju banyere akụkọ a sị bụ mpụtara nyocha maka ihe mere na Lekki Toll Gate n'ụbọchị Tuzde.
Ọ sị na onye ọbụla sị na e gburu nwanne maọbụ nwa ya pụta bịa kwuo banyere ya.
Lai Mohammed sị na e depụtara akụkọ iji mechuo gọọmentị ihu na-enweghi akaebe ọbụla.
Ọ sị na ndị mere nyocha ahụ tụkwasịrị uche ha n'akụkọ ha nụrụ ma mee mkpebi ha.
Mohammed gara n'ihu kwuo na ndị mere nyocha ahụ elebaghị anya na ndị ọrụ nchekwa e gburu maọbụ ụlọahịa ndị mmadụ a lara n'iyi.
Lekki Toll Gate Massacre report: Anyị na-eche ka anyị nụ ihe gọọmentị etiti ga-eme - Mba Amerịka

Ebe foto si, Getty Images
Otu jikoro ndị bụ isi a hụrụ kwawa okpu n'okwu ndị ntorobia mere ngaghariiwe EndSARS bụ Endsars Movement egosila obi ụtọ ha na mpụtara nnyocha nke komiti lebanyere anya na mkpamkpa kpara na Lekki Toll Gate wepụtara.
N'akwụkwọ mgbasaozi otu a wepụtara ụbọchị Tuzde, ha kwuru na mpụtara nnyocha ahụ bụ 'ezi nzọpụ ụkwụ mbụ na ogologo njem" idozi ihe mebiri emebi.
Otu ahụ gara n'ihu kwuo na uru mpụtara nnyocha ahụ ga-ezu oke ma ọ bụrụ na gọọmenti were obiọcha mezuo ihe komiti ahụ turu alo ka e mee.
Ha kwukwara sị, "Komiti ahụ nke Jọstis Okuwobi nọ n'isi ya gara n'ihu gbaa n'anwụ, ihe ụfụ ụmụ Naijiria ga-agabiga n'aka ndị ọrụ nchekwa."
Nnyocha gosikwara kpomkwem na e gburu imirikiti ndị mmadụ na Lekki Toll Gate site n'ịkpọpụta aha ndị ọ metụtara ma ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ dịka ndị ọrụ nchekwa kwesịrị ichekwa ha gbara ha egbe."

Ebe foto si, ENDSArs Movement
Ihe ndị a ma ama na-ekwu maka mpụtara nnyocha Lekki Toll gate na-ewu ewu
Ndị a ma ama gụnyere ndị otiegwu, ndị ọkpa ọchị na ndị ọzọ pụtakwara tinye ọnụ na mpụtara nnyocha ahụ.
Falz

Ebe foto si, Falzthebadguy/Instagram
Ọkaiwu, Otiegwu na ọkpa ọchị a ma bụ Falz so na ndị kwuru okwu maka nke a.
Ọ sị "mpụtara dooro anya ka ihe, a ga-emezuriri ihe niile e dere n'ime ya"
Debo Macaroni

Ebe foto si, Mrmacaroni/Instagram
Onye ọzọ bụ Debo Macaroni na-ajụzo gịnị ga-eme ugbua?
N'ọṅụ ya "Ndị na-ekwu eziokwu kemgbe afọ 2020 ka kwụ n'ihe ha kwuru, gịnị ka gọọmentị ga-eme?"
Ugbua gọọmentị mere nchọpụta a, kedụ ntaramahụhụ dịịrị ndị niile ikpe mara?
Ruggedman

Ebe foto si, Ruggedybaba/Instagram
Ọma mbem bụ Ruggedman sị "ugbua eziokwu anyị mabu maka ihe mere na Lekki Tollgate pụtara ihe, unu a ga-ewepu mmachi Twitter machie onwe unu?"
Okwu ya na-abịa dịka ụfọdụ mmadụ na-eche na gọọmentị etiti machiri Twitter maka etu esi jri ya gbasaa ozi n'oge ngagharịiwe End Sars.
Davido

Ebe foto si, Davido/Instagram
David Adeleke bụ otiegwu na-ewu ewu kwuru maka etu "ha mere anyị ka anyị chee na-anyị na-agbapụ ara"
Ihe ọzọ ọ jụrụ bụ "Gịnị ga-emezi ugbua?"
Ndị agha Naijiria agbajọọla etu e siri wepụta mpụtara nnyocha ogbugbu mmadụ na Lekki Toll Gate

Ebe foto si, Nigerian Army
Ọchịagha Naijiria bụ Lucky Irabor akatọọla usoro e si zipụ ozi mpụtara nnyocha mkpamkpa kpara na Lekki Toll Gate n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Ọktoba, afọ 2020.
O kwuru nke a oge o mere njem nleta o mere n'Edo steetị n'ụbọchị Tuzde(Nov 16,2021), si na e kwesiri idepụta mkpebi so nnoycha ahụ n'akwụkwọ ọcha Bekee kpọro 'White paper' tupu ọ puta n'ọha.
"Ma ozi dị n'akwụkwọ ahụ abụ eziokwu ka na ọ bụghị, enweghị m ike ikwu. Mana ihe nwere ikwu bụ na e nwere ụzọ tosiri bụ inyefe akwụkwọ ozi ahụ n'aka ndị hiwere komiti ahụ."
"E nwee akwụkwọ ọcha nke mmadụ nweziri ike ịgbado ụkwụ were kwuo okwu."
"Mana ka o sila dị, ndịagha Naijiria bụ ndị na-arụ ọrụ ha dịka o kwesịrị. O kwesịghị ka ụmụ Naijiria na-ekwu okwu ọjọọ banyere ụmụnwoke na ụmụnwaanyị a na-agba mbọ ichekwa Naijiria."
"E nwee, nsogbu e nwerekwara ụzọ esi eso ya."
Ihe mba Amerịka kwuru maka mpụtara nnyocha Lekki Toll Gate

Ebe foto si, Getty Images
Mba Amerịka ekwuola na ha nabatara mpụtara nnyocha ihe mere na Lekki Toll Gate ma kelee kọmiti mere ya.
Ha kwukwara na ha na-atụzi anya ka gọọmentị Legọs steeti nakwa gọọmentị etiti lebanye anya n'ebubo eboro ha.
Nke a na-abịa dịka kọmiti nyochara ihe mere na Legọs oge ngaghriwe Endsars wepụtara nchọpụta ha nke kwuru na ndịagha gbagburu imirikiti ndị mmadụ.
N'ozi si n'ụlọọrụ nnọchiteanya Amerịka na Naịjirịa kwuru n'ụbọchị Tuzde na ha na-ele anya ịhụkwa etu gọọmentị ga-esi meso ezinaụlọ ndị ihe mere nakwa ndị ihe mere n'onwe ha.
"Anyị na-atụ anya na gọọmentị Legọs ga-egosi njirimara ọchịchị ziri ezi n'etu ha si eso ihe ndị mere na Lekki Toll Gate n'ụbọchị 20 nke Ọktoba afọ 2020".

Ebe foto si, LASG/Getty Images
Aka na-achị Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu ekwuola na ya agụbeghị akwụkwọ mpụtara nnyocha nke kọmiti o hiwere ka e mee nnyocha ihe mere na Lekki Toll Gate na ngagharịiwe Endsars na steeti ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ya bụ Gbenga Akosile bụ onye kwuru nke a dịka mpụtara nke gbapuru na-ewu na soshal midia.
Akọsile kwuru sị, "Gọvanọ ahụbeghị akwụkwọ ahụ,ọ gụbeghị ya".
"O hiwela kọmiti mmadụ anọ ga-ele anya na mpụtara nchọpụta ahụ e mere ma wepụta ihe ha hụrụ n'izuụka abụọ na abịa."
O kwuru na ọ gbara ya gharị ihụzi ozi dị n'akwụkwọ ahụ na soshal media.
Ihe ndị dị n'akwụkwọ mpụtara nnyocha e mere banyere ihe mere na Lekki Toll Gate:

Ebe foto si, Getty Images
Ihe ndịagha Naijiria mere iji kpuchie na ha gbagburu imikiriti mmadụ na Lekki Toll Gate - Komiti mere nnyocha
Kọmịtị e hiwere inyocha ngagharịiwe Endsars na Legọs eboola ndị agha Naijiria ebubo ịgbalị ikpuchi ihe mere na Lekki Toll Gate, Legọs, n'abalị 20/10/2020.
Ndị agha Naijiria nọrọ n'abalị 20 nke ọnwa Oktoba afọ 2020 wụọ ndị ntorobia nọ na Lekki Toll Gate na-eme ngaghariiwe maka mkpagbu ndị uweoji mgbọ nke gburu ọtụtụ n'ime ha.
N'ozi mpụtara nnyocha komiti nyochara mkpamkpa ahụ wepụtara n'ụbọchị Tuzde(Nov 16/11/2021), ha kwuru na ha nwere ihe akaebe gosiri na dịka ndị agha Naijiria wụchara ndị na-eme ngagharịiwe mgbọ na Lekki Toll Gate, Legọs, n'abalị iri abụọ nke ọnwa Oktoba , afọ 2020, na ha buru ozu mmadụ 11 n'ụgbọala ha pụọ.
Akwụkwọ ozi ha wepụtara kwuru sị, "Otu onye ha gbara egbe bụ onye ha chere na ọ nwụọla ma tụnye ya n'ozu ndị ọzọ ha buru pụọ, aha ya bụ Olalekan Sanusi bụ onye gbapụtara were gbaa ama na ọ bụ ozu iri na otu(11) bụ ihe ndị agha tụnyere n'ụgbọala ebe a tụnyere ya."
"Miss Dabira Ayuku kwukwara na ya bụ ihe bụ ezie dịka o kwuru na ya hụrụ ozu mmadụ asaa. A tụnyere n'ụgbọala truck' na Lekki Toll Gate n'abalị 20, Oktoba , 2020."
Komiti ahụ kwukwara ndị agha gburu mmadụ iri na otu, merụọ mmadụ iri abụọ na anọ (24) ,ebe mmadụ anọ ka na-efu efu ka ndị agha gbachara ndị na-eme ngaghariiwe n'udo egbe n'abalị ahụ.

Ebe foto si, Lagos Judicial Panel on ENDSARS

Ebe foto si, Lagos Judicial Panel on ENDSARS
Lee ihe ndị ọzọ gbara ọkpụụ kpụ komiti ahụ chọpụtara:
'Ihe mere na Lekki Toll Gate n'oge ngagharịiwe End SARS bụ 'massacre' - Nnyocha

Ebe foto si, EPA
"Nchọpụta anyị gosiri na etu e si gbuo ndị mmadụ na Lekki Toll Gate n'oge ngagharịiwe End SARS, bụ mkpochapụ (massacre)".
Nke a bụ ọkpụrkpụ ihe si na mpụtara nnyocha e mere gbasara ngagharịiwe nke ndị ntorobịa Naịjirịa mere n'ọnwa Ọkụtoba afọ 2020.
Cheta na gọọmentị Legọs steeti hibere kọmiti ga-eleba anya n'ihe mere n'oge ngagharịiwe ahụ nke butere ọnwụ ọtụtụ mmadụ.
Kọmiti a wepụtara mpụtara nnyocha ha n'ụbọchị Mọnde, abalị iri na ise nke ọnwa Nọvemba.
Ọ bụ eziokwu na ha agbaghị ya bụ mpụtara nnyocha n'anwụ, mana mpụtara ahụ mechara pụta ihe.
Amabeghị onye tinyere ya n'ịntaneetị, mana ndị so na kọmiti ahụ gwara BBC na nke ahụ dị n'ịntaneetị bụ eziokwu.
Lee ihe nnyocha ngagharịiwe End SARS kwuru gbasara ihe mere na Lekki Toll Gate
- Gọọmentị legọs steeti kpọrọ ndị agha ka ha gaa na Lekki Toll Gate n'abalị ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Ọkụtoba afọ 2020
- Ndị agha gbagburu ma merụọ ọtụtụ mmadụ ahụ na Toll Gate ahụ
- Ndị a e gburu nakwa ndị e merụrụ ahụ ejighi egbe ọbụla, ha emeghị ihe ọbụla iji kpasuo ndị agha iwe, ha ncha nọcha n'ala, na-efe ọkọlọtọ Naịjirịa ma na-ekwe ukwe 'National Anthem'.
- Ndị agha Naịjirịa gbochikwara ụgbọala gbatagbata (ambulance) bịara inyere ndị merụrụ ahụ aka
- Ndị agha Naịjirịa agbasoghị iwu ha dịka ha na-eme ihe ndị a
- Ndị uweojii gakwara na Lekki Toll Gate n'abalị ụbọchị iri abụọ, nakwa n'ụtụtụ ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Ọkụtoba afọ 2020
- Ndị uweoji gbara egbe, tie ndị mmadụ ihe ma merụkwaa ọtụtụ ndị ọzọ ahụ nke butere ọnwụ ụfọdụ n'ime ha
- Ndị uweojii gbara mbọ ikpuchi ihe ọjọọ a ha mere, site n'ịtụtụ mgbọ egbe niile ha gbara
- Ụlọọrụ 'Lekki Concession Company' gbara mbọ izo ihe merenụ, dịka ha ekweghị enye kọmịtị ahụ na-eme nnyocha ụfọdụ ihe dị mkpa maka nnyocha ha
- Ụlọọrụ LCC jikwa ụzọ aghụghọ kpaa onyonyo ha aka, ma wepụ ihe ndị dị aṅaa tupu ha enye kọmiti ahụ ya bụ onyonyo
- Kọmiti chọpụtakwara na a gbara mbọ ka e kpuchie ihe ahụ merenụ site n'ịga zachaa Lekki Toll GAte n'ụtụtụ ya bụ ihe mechara
Ihe kọmiti chọrọ ka gọọmentị mee gbasara nchọpụta ha
- Ịhazigharị ọnọdụ ọrụ ndị uweojii Naịjirịa, nke gụnyere: inye ha ọzụzụ dị mma, iwelite ọnọdụ ọdịmma ha, nakwa ebe obibi ha
- Ịta ndị uweojii na ndị agha aka ha dị n'ịgbu ndị mmadụ na Lekki Toll Gate ahụhụ
- Ihibe ọgbakọ ebe gọọmentị na ndị ntorobịa ga na-enwe mkparịtaụka
- Ihibe ụlọikpe ga na-ahụ maka mmekpa ahụ ndị uweojii n'ebe ndị nkịtị nọ
- Ịrịọ ndị ntorobịa so na ngagharịiwe End SARS mgbaghara n'ihu ọha obodo
- Ịkwụ ndị niile merụrụ ahụ, nakwa ezinụlọ ndị nwụrụ na Lekki Toll gate ụgwọ iji tie ha aka n'obi
- Itinye ihe ncheta maka ndị tufuru ndụ ha na Lekki Toll Gate
- Ka enye Lekki Toll Gate aha ọhụrụ ka ọ bụrụzie 'End SARS Toll Gate"
- Agaghị ana ego na 'toll gate' ahụ n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Ọkụtoba afọ ọbụla, iji cheta ndị nwụrụ n'ebe ahụ
- Ka ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Ọkụtoba afọ ọbụla bụrụ 'End SARS Day'.
Occupy Lekki Toll gate: Ndị Igbo wepụ aka na ngagharịiwe ọzọ na Legọs - Ohaneze Ndigbo

Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ ndị mmadụ gosipụtara iwe ha na Twitter dịka ebidokwara ịna ego na Lekki toll gate nke dị na Legọs steeti.
Cheta na-agbara ya bụ tollgate ọkụ n'oge emere ngaghariiwe Endsars.
Onyeisi Ohaneze Ndị Igbo nke dị na Legọs steeti bụ Solomon Ogbonna tinyere ọnụ na ya bụ okwu.
O kwuru na ndị Igbo anaghị emebi kama ha na-edozi ọbọdọ ha nọ n'ime ya karịa obodo ha n'ala Igbo.
Gere ya n'uju ebe a.
Iwe ọtụtụ mmadụ bụ na-ekpechabeghị ikpe maka mpụtara aka ike ndị uweojii ma gọọmentị a gaa n'ihu bido ịnakọwa ego ọzọ na ya bụ Tollgate.
Ebe ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ iji kosipụta iwe ha maka ndị ha sị nwụrụ oge e mere ngaghariiwe Endsars.
Kedụ nke bụ #Defendlagos?
Ka ndị nke #occupylekkitollgate na-akwado ime ngaghari iwe ka ndị ọzọ na-akwado nke ha kpọrọ #Defendlagos.
Ndị nke a na-ekwu na ha agaghị anọ nkịtị ndị omekome na ndị ọzọ emebie Legọs steeti dịka ha si na ndị a mere na mbụ.
Ụfọdụ n'ime ndị a na-ekwu na ọ bụ ndị otu Ipob na-akpa nkata iji were ohere a mebie ihe na Legọs steeti.
Kama dịka o siri dị, ụfọdụ na-eji ya akpa oke agbụrụ .
Ihe ndị ama ama na-ekwu maka ya bụ ihe?
Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ oti egwu ama ama bụ Paul Okoye eji Rudebot mara ka otinye ọnụ na ya bụ okwu.
Okoye kwuru na onweghị ihe ọ nwere ịkwu maka ihe na-eme ugbua.
Reno Omokri
Reno Omokri bụ onye rụburu ọrụ dịka onye enyemaka pụrụiche oge Godluck Jonathan nọ n'ọchịchị kwuru n'akara twitter ya na ọ kwadoro ndị na-akwado imi ngagharịiwe ịnọchị Lekkitoll Gate.
Omokri kwuru na osote onyeisiala Naijirịa bụ Yemi Osinbajo kwere ndị ntorobia nkwa na ọ ga ahụ na ndị nwụrụ n'oge ngaghariiwe Endsras anwụghị n'efu, were jụọ na ọ bụ site n'inye onye bụbu onyeisi ndịagha Naijirịa bụ Tukur Yusuf Buratai ọrụ dịka onye nnọchite anya Naijirịa na mba ọzọ ka o ji mezuo nkwa ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
DJ Switch
Obianuju Udeh eji DJ Switch mara kwuru na ya kwadoro ndị na-akwado ịnọchị Lekki Toll gate.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Omoyele Sowore
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Lee Akụkọ ụgha sọ ngagharịiwe Endsars

Ebe foto si, AFP
Ngagharịiwe malitere na mbido ọnwa a na Naịjirịa dika ndị mmadụ na-akpọ gọọmentị oku ka ọ kagbuo ngalaba ndị uweojii a kpọrọ "Special Anti-Robbery Squad" (SARS).
Akụkọ atụmatụ a malitere iwu n'ụwa dum, dịka puku kwa puku akụkọ maka ya pụtara na soshal midia, mana ọ bụghị ha niile bụ eziokwu.Anyị tinyere anya n'ụfọdụ akụkọ ụgha metụtara ngagharịiwe a etinyere n'ịntanetị.
Nwa ada ndị uweojii gburu ụmụnne ya nwokeFoto na-emetu n'obi nke otu nwaànyị aha ya bụ Ugwu Blessing Ugochukwu n'ebe ọ na-ebe akwa dịka o ji ọkọrọtọ Naịjirịa, ma makwuru n'elu akpụrụakụ wuru ewu na Twitter.

Foto a bụ eziokwu dịka e sere ya oge nwa ada sonyere ngagahrịiwe e mere n'Enugwu.
Mana, dịka a na-eke foto ahụ, ndị mmadụ malitere itinye akụkọ ụgha na ya."Ọ bụghị otu nwanne...3 n'otu ụbọchị...ka e gburu tụnye n'ime weelu," bụ ihe otu onye dere na foto ahụ ekwesara ọfụma na soshal midia, dịka a na-akọwa na ndị uweojii gburu ụmụnne ya.
Mana Gideon Obianime bụ onye na-ekwuru Ugochukwu, gwara anyị na nke ahụ abụghị eziokwu.Ọ sị na ndi Sars nwuchiri nwaànyị ahụ n'afo 2018 mana onweghi nwanne ya ha gburu.
"Ọ bụ ndị mmadụ na-etinye akụkọ ndị a nafoto ahụ. Ọ na-ebutere ya ilo ugbua."Ndi agha agaghị awakpo gị ma ijide ọkọlọtọ Naịjirịa

Ebe foto si, EPA
Akukọ amabeghị ma ọ bụ eziokwu wuru ewu ọfụma - na onye agha agaghị agba onye ji ọkọrọtọ Naịjirịa egbe.
Ekesara atụmatu a ọfụma na Twitter, Facebook nakwa Instagram, dịka ụfọdụ na-ekwu na ọbụ usoro ndị agha Naịjirịa.
Ọ bụ na foto esere mkparịtaụka mmadụ abụọ nwere ka akụkọ a si pụta.
N'ime akụkọ ahụ, otu onye gwara onye ọzọ na ọ bụ nna ya bụ onye agha gara ezumike nka gwara ya.
Otu onye n'ime ndị na-akparịta ụka ahụ sị ka ekesaa ya ka ndị na-enme ngagharịiwe hụ ya.
Enweghị aka ebe ma ncha na ihe a bụ eziokwu.
Ụfọdụ n'ime ndị kere ya ewepụla ya dịka ndị mmadụ gwara ha na ọ bụghị eziokwu.
Onyekachi Umah bụ onye ọkaiwu gwara BBC na enwere iwu maka ịkwanyere ọkọrọtọ Naịjirịa ugwu, ma sịkwa: "Na mmadụ ji ọkọrọtọ Naịjirịa abụghị na ndị agha agaghị eme ihe ha chọrọ ime."
Anyi jụru ndị agha maka ihe a, mana ha asabeghi.O nweghị onyeisi Naịjirịa sị na ngagharịiwe a na-eme bụ ihe ụmụaka

Ebe foto si, Getty Images
Ka ngagharịiwe a malitere otu ihe onyonyo e tnyere na soshal midia gosiri otu onye ndụmọdụ Onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Femi Adesina ebe ọ dị ka ọ na-asị na ndị na-eme ngagharịiwe na-eme "ihe ụmụaka".
Ndị mmadụ malitere ikesa ihe onyonyo ahụ, were na-ekwu na "ya bụrụ na ị naghị iwe iwe ọfụma, ihe onyonyo a ga-enyere gi aka."
Mana ihe onyonyo ahu bụ nke ochie, ma bụrụkwa ihe achabiri, nke gbanwere nghọta ha.
Onweghi ihe ọbụla gbasara ihe nyonyo ahụ na okwu Sars.
N'oge ahụ, Adesina nọ Televison ekwu maka ngagharịiwe.
Mana a chabiri ihe onyonyo e tinyere na Twitter were wepụ mbido okwu ya ga-akọwa ihe ọ na-ekwu ọfụma.
Channels TV, bụ ụlọ ntaakụkọ ọ bụ akụkọ ha ka emere nchabi a ekwuola okwu banyere ya ma kọwa ya ọfụma.


















