End SARS: Ndị ekperima etinyela ndị mmadụ n'ụjọ n'ụfọdụ obodo na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ

Ọtụtụ ndị mmadụ nọ n'ụjọ nakwa ize ndụ n'ogbe dị na steeti dị icheiche na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ dịka ụfọdụ ụmụokorobịa weghaara ngagharịiwe 'End SARS' ma mezie ya ka ọ ghọọ nnukwu ọgbaghara.
N'Enugwu, Abia nakwa ebe ụfọdụ n'Imo steeti, ndị ntaakụkọ BBC kwuru na ụmụokorobịa wakporo ọtụtụ ụlọọrụ nakwa ụlọahịa, mebie ihe ndị mmadụ ma zurukwa ọtụtụ ihe.
Ndị mmadụ chịzị obi ha na-aka n'Enugwu

Ọgbaaghara kawanyere njọ n'Enugwu n'ụbọchị Tọzde mana BBC chọpụtara na ya bụ ọgbaaghara esighị n'aka ndị na-eme ngagharịiwe 'End SARS'.
Anyị hụrụ ụmụokorobịa ka ha mechiri ụzọ Enugwu niile na-anakọ ndị mmadụ ego.
Malite n'Ogui Road gawa Emene ị ga-ahụ ihe karịrị 'checkpoint' iri abụọ na ise ebe ndị ntorobịa gbachiri ụzọ.
Ndị nọchiri ụzọ jicha mma, osisi na egbe na-anapụ ndị mmadụ egotupu ha ekwe ka onye ọbụla gafere.

Ọtụtụ n'ime ha na-aṅụ anwụrụ ike na mmanya ga-ajụ gị ma ị bụ onye Naijiria ka ọ bụ Biafra, ọ bụrụ na ịzaghị ihe ha chọrọ, ha nwere ike imeru onye ahụ ahụ.
Ha mebikwara ọtụtụ ụgbọala nwere ihe dịka ọkọlọtọ Naijiria maọbụ nke ndị 'Road Safety', ma na-ekwu na ha achọghị ihe Naijiria ọbụla.
Mana ndị agha kwụrụ chịm n'ihu ọdọụgbọelu Akanụ Ibiam Enugwu ma kee nkwụcha n'ihu ebe ahu iji gbochie ndị ntorobịa ahụ ịbanye na ya.
Ọtụtụ ụlọakụ dị n'Enugwu ka ndị omekome ahụ kuriri ma banye n'ime ya buruchaa ihe.

Ha gụnyere: First Bank Emene, First bank Presidential Road, Access bank Presidential Road, Access bank Agbani Road site Nise, First Bank Agbani Road site Nise, First Bank Abakpa, nakwa ọtụtụ ọba ego ndị ọzọ.
Iji maa atụ, n'ụlọakụ 'First Bank dị n'Abakpa, ha bukọsịrị igwe ntụ oyi (air-conditioners), igwe kọmputa, igwe laptop, oche, nakwa tabulu, ma wufusịa akwụkwọ ndị ụlọakụ ahụ n'iro.
Mana BBC ejighi n'aka ma ha abanyere na ebe a na-akpọ 'strong room' n'ụlọakụ ahụ nke bụ ebe a na-edebe ego.

Ka ọ dị n'ụtụtụ tata bụ Fraịda 23 October, mgbo egbe adawakwala ọzọ.
N'Asata, ụfọdụ ndị bi n'ogbe Secretariat Quarters gwara BBC na ha tetara ụra were hụ na ụmụokorobịa karịrị iri anọ ezukọọla n'ogbe ha, buruchaa egbe, mma na okpiri nakwa ọkọlọtọ Biafra.
Mana o teghị aka, ndị uweojii na ndịagha bịara chụsasịa ha.
Ka ọ dị u, ndị mmadụ ji nwayọọ n'enyo iji mara etu obodo si dị.
Obodo ederela jimjim n'Abia steeti

A nụrụ ụda egbe ebe o buru ibu n'obodo Ụmụahia, isiobodo Abịa steetị n'ụbọchị Tọzde dịka ndịagha na ndị uweojiii gbalịrị igbochi ndị ntorobịa na-akpa aghara.
Onye ntaakụkọ BBC kwuru na ụda egbe karịrị akarị n'ihi na kepukepu kwuru nandị ntorobịa ahụ chọrọ ịwakpo ụlọ mkpọrọ dị n'Umahia.
Ụda egbe ahụ dara ihe dịka awa atọ tupu ọ dajụọ.
N'Aba, ndị ekperima wakporo ụlọakụ dị icheiche ma mebisie ihe ebe ahụ.
Ụlọakụ nke a metụtara bị 'First Bank' na 'Union Bank' na ụfọdụ ndị ọzọ.
Ha wakpokwara ụlọ 'Aba Town Hall' nakwa 'Fire Service' ma mebie ihe.
Ndị ekperima wakpokwara ahịa ebe a na-ere ịyabasị ma mebie ngwaahịa ndị mmadụ.
Ka ọ dị ugbua, o nweghị onye gara ahịa maọbụ ọrụ dịka gọọmentị tinyere iwu mmachi mkpagharị.
Ọtụtụ ka chị obi n'aka na-eche ihe ụbọchị ga-eweta.
Mana gọvanọ Abia State bụ Okezie Ikpeazu enyela iwu ka e hiwe kọmitii ga-agụkọ ngwo ngwo gọọmentị na nke ndị mmadụ e mebiri n'oge ọgbaghara a maka ibido rụziwe ha.
Gọvanọ Ebonyi ebutuola mmachi mkpagharị

Ebe foto si, Gọọmentị Ebonyi steeti
Ihe adajụtụla ugbua n'Ebonyi steeti dịka gọvanọ Dave Umahi wetulatara mmachi mkpagharị o tinyere na steeti ahụ.
Ugbua, mmachi a ga-amalite n'elekere asatọ nke abalị ruo elekere asatọ nke ụtụtụ.
Mana ụfọdụ n'ekwu na a kpọchiri ụzọ akpọchi na mpaghara Kpirikpiri.

Ọ bụ eziokwu na ahịa emepeghi taa, mana ụfọdụ ụmụwnwaanyị pụtara ahịa.
Ndị gwara BBC okwu kwuru na obi adịghị ha mma etu e si kpọchie ahịa n'ihi na o metụtara ebe ha si enweta ihe oriri.
Egwu ka dị n'Owere n'ihi ọgbaaghara

Obi ka koro ndị mmadụ bi n'Owere n'elu n'ihi mkpamkpa ndị omekome na-akpa kamgbe ọgbaaghara dapụtara nke sitere na ngagharịiwe End SARS.
Nke a bụ n'agbanyeghi ihe onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru n'abalị Tọzde sị ndị mmadụ garawa mkpa ha.
Obi iko n'elu a bidoro mgbe kepukepu kwuru na e gburu ndịagha abụọ ma gbaa ụlọ ndị uweojii ọkụ na mpaghara Nworieubi nke dị na kansulu Mbaitolu.
Mana BBC amatabeghị ma nke a ọ bụ eziokwu ka ọ bụ asị.

N'agbanyeghị iwu onye apụtala ezi nke gọvanọ Hope Uzodinma tinyere iji gbochie ọgbaghara ahụ, ụfọdụ ndị ntorobịa ka ji ohere a anapụ ndị mmadụ ego n'ụzọ.A na-ele anya n'ọtụtụ ndị mmadụ ga-ekute ume ndụ dịka ndị uwe ojii nke steeti ahụ fooro ntutu taa na ha ga-ebido itinye iwu a gọvanọ steeti ahụ tinyere n'ọrụ iji chekwaa ndụ na akụnụba ndị mmadụ.
Anambara dara jụụ ugbua

Anyị chọpụtara na ihe adatụla jụụ n'Ọka, isi obodo Anambara steeti, nakwa n'Ọnịcha.
Oge onye ntaakụkọ BBC kpagharịrị n'Ọka, okporo ụzọ tọgbọ chakoo dịka ụlọ ahịa niile gbachiri agbachi.

Otu onye anyị gbakwara ajụjụ ọnụ sị na mpaghara ebe o bi na 3-3 Ọnịcha, dara nnọọ jụụ karịa etu ọ dị ụbọchị Tọzde.
Cheta na gọvanọ Willie Obiano tinyere mmachi mkpagharị na steeti ahụ niile.
Ihe nkiri ga-amasị gị:











