Abia State Police: Amaghị m ma e gbuola ndị omekome gburu di na nwunye

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ na foto na-efegharị na sosha midia gosiri na e gbuola ndị omekaome a sị gburu di na nwunye n'Umuahia.
Nke a na-abịa n'ime otu ụbọchị ndị uweojii Abia steeti gbachara ndị a n'anwụ ụnyaahụ.
Mana mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia Steeti bụ Geoffrey Ogbonna, ọ sị na ọ maghị ma nke ọ bụ eziokwu.
O kwuru na ọ bụ n'akụkọ ka ọ nụkwara sị na e gbuola ndị ahụ dịka na ọ nọghị nso n'ụlọọrụ ya taa.
Akụkọ ogbugbu ndị a ebutela oke okwu na soshal ebe ọtụtụ mmadụ na-ekwu na e kwesịrị ịkpọpụ ha n'ụlọikpe.

Ebe foto si, Getty Images
Cheta na aka ndị uweojii Abịa Steeti kpara ndị omekome a mmadụ ise ma gbaa ha n'anwụ n'Ụmụahịa.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Geoffrey Ogbonna sị na a ka na-achọ otu onye n'ime ndị a ebe nyocha ka na-aga n'ihu.
Ọ sị n'ụbọchị Satọde, oge di na nwunye si ahịa na-alọta n'ebe a kpọrọ Ugurube ka ndị omekome a wakporo ha nara ha ego ha ji ma gbagbuo ha n'ihu ụmụ ha abụọ.
Ogbonna kwuru na ndị a gakwara n'okporoụzọ Bende nara onye ọzọ akpa ya na ihe ndị ọzọ.
Ndị uweojii malitere chụwa ha ọsọ ma jide mmadụ abụọ n'ime ha bụ ndị nyeere ndị uwojii aka ka e jide ndị ọzọ.
Ndị omeiwu n'Imo si PDP makpuo APC

Ebe foto si, Twitter/Nass
Onyeisi ụlọomeiwu Imo Steeti bụ Collins Chiji na mmadụ asaa ndị ọzọ esila na pati Peoples Democratic Party (PDP) mabanye na All Progressive Congress (APC).
Collins kwupụtara mwefe na Pati a dịka ha na-enwe ọgbakọ ndị ụlọomeiwu n'ụbọchị Tuuzde.
Nzukọ a bụ nke were naanị nkeji iri na ise bịara na mpịachi dịka ọ kpọpụtachara aha ndị omeiwu wụfere na pati ọzọ.
Ndị omeiwu a gụnyere; Uche Ogbuagu (Ikeduru), Dominic Ezerioha (Oru West), Chigozie Nwaeri (Oru East), Kanayo Onyemaechi (Owerri West).
Ndị ọzọ bụ Kennedy Ibe (Obowo), Onyemaechi Njoku (Ihitte/Uboma) na Eddy Obinna (Aboh Mbaise).
Dịka ọ dị ugbua APC nwere mmadụ iri na asatọ, ebe PDP nwere mmadụ asatọ n'ụlọomeiwu Imo Steeti.
Aka akpara nwaanyị ọzọ gburu di ya

Ebe foto si, Getty Images
Na-erughi awa ole na ole ụlọikpe machara Maryam Sanda Ikpe ọnwụ maka igbu di ya, ndị uweojii nke Katsina state akparala nwata nwaanyị gbara afọ 19 aha ya bụ Rabi Shamsudden maka ebubo iji mma gbuo di ya.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Gamba Isah kwuru na ọ bụ eziokwu ma sịkwa na ha ka na-eme nnyocha ha.
Osinbajo gara Ụmụahịa
Osote onyeisiala Naịjiria bụ Yemi Osinbajo tụrụ ụkwụ n'Ụmụahịa dị n'Abịa steeti ebe ọ gara emume maka afọ iri ise agha Biafra biri.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Hope Uzodinma bụ gọvanọ Imo steeti na Okezie Ikpeazu bụ nke Abịa so ya gaa na War Museum ma nwekwaa nzukọ ebe Osinbajo kwuru na nkata agha a ka bụ ihe e kwesịrị ịkpa ka ndị mmadụ nweike gbakee ma gbaghara.
Ọnọdụ ọrịa Coronavirus,
Ọrịa Coronavirus na-akawanye njọ, dịka o gburula mmadụ 106 na mba Chaịna ebe otu si Beijing.

Ebe foto si, AFP
Enwebeghị ọgwụgwụ ya bụ ọrịa ma ọ bụ ihe mgbochi ebe ndị mba Chaịna sị na ọ bụ ndị agadị na ndị nwere ọrịa ume ka ọ kacha egbu.
Ọnụọgụgụ ndị bu ya bụ ọrịa na mba Chaịna esila na 2,835 ọ nọ na ya wụbanye na puku 4,515 n'ime naanị otu ụbọchị.
N'ihi etu ọrịa a si amụbanye, ndị mba Japan na-akwado izipu ụgbọelu ga-ebulata ndị mba ha nọ n'obodo Wuhan bụ ebe ọrịa a si selite isi.

Ebe foto si, Getty
N'otu aka ahụ, mba Kenya anwụbala otu nwaakwụkwọ si mba Chaịna lọta a na-enyo ma o bu ọrịa a n'ụlọọgwụ.
Nke a emeela ya mmadụ abụọ a na-enyo na ha nwereike ibu ọrịa n'Afrịka; onye nke ọzọ nọ na mba Aịvọrị Kost.
N'Egwuregwu,
Lebron James bụ dike a ma ama n'ịtụ bọolụ nkata, ekwuputela mwute ya maka ọnwụ ezigbo enyi ya bụ Kobe Bryant na nwa ya nwaanyị bụ Gigi.
James kwuru na obi na-agbari ya na Bryant na mmadụ asatọ ndị ọzọ nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu, mana nkwa ọ na-ekwe ya bụ na ọ ga-ahụ na o buru ihe ndị ọ hapụrụ e ji echeta ya gaa n'ihu.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 1
N'akụkọ ọzọ, ndị otu egwu bọọlụ Arsenal egosila na ha nwere agba dịka ha ji ọkpụ goolu abụọ asatara otu were merie ndị otu Bournemouth n'asọmpi Iko FA.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 2
Arsenal ga-ezute ndị otu Portsmouth n'ụbọchị nke atọ n'ọnwa Maachị, maka agba nke ise n'asọmpi a.
Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji:










