Emeka Ihedioha: Ngagharịiwe amalitela n'Abuja maka mwepu gọvanọ chịburu Imo steeti

Ndị pati PDP eburula ngagharịiwe ha gaa n'Abuja bụ isi obodo Naịjirịa maka mwepu ụlọikpe kachasị wepụrụ Emeka Ihedioha dịka gọvanọ Imo Steeti.

Ndị so na ngagharịiwe a bụ onyeisio ha bụ Uche Secondus, Peter Obi, Sịnetọ Enyinnaya Abaribe nakwa ndị ọzọ.
Cheta na ngagharịiwe a malitere n'Owere ụnyaahụ, nakwa ebe ndị ọzọ gụnyere Abia, Akwa Ibom nakwa Katsina Steeti.

Mana ọ dịka ngagharịiwe abụrụla ihe ọgbaghara dịka a kwaturu ụgbọala ndị nkwado PDP.

Ebe foto si, PDP/Twitter
Ngagharịiwe amalitela ugbua n'Owere, isi obodo Imo steeti maka mwepu ụlọikpe kachasị wepuru Emeka Ihedioha dịka gọvanọ steeti ahụ.
Ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' bụ nke Ihedioha nọ na ya, bụ ndị na-ahazi ngagharịiwe a.
Ndị na-eme ngagharịiwe a na-ekwu na mkpebi ụlọikpe kachasị gbasara ntuliaka e mere n'afọ gara aga akwụghị ọtọ.
Cheta na 'Supreme Court' nyere iwu abalị anọ gara aga ka Ihedioha rituo n'oche gọvanọ Imo.
Ha kwuru na ọ bụ Hope Uzodinma nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'All Progressives Congress' (APC) meriri ya bụ ntuliaka.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Ụlọikpe kachasị kwuru na ọ dị ọtụtụ vootu Hope Uzodinma nwetara na ya bụ ntuliaka bụ nke INEC kụchapụrụ.
Ha nyere iwu ka a gbakọnye vootu ndị ahụ n'aha Uzodimma, nke mere ka votu ya gbalie
Mana ọtụtụ ndị mmadụ n'Imo steeti na-ekwu na ikpe ahụ ezighi ezi.

Dịka ngagharị iwe ahụ na-aga n'ihu, ọtụtụ ụmụnwaanyị dara n'ala na-ebe akwa na-arịọ ka e lebaa ikpe ahụ ụlọikpe kachasị kpere anya.
Ọtụtụ ndị BBC Igbo gbara ajụjụ ọnụ kwukwara na mkpebi 'Supreme Court' bụ ikpe mara eziokwu.
Otu onye n'ime ha kwuru sị: "anyị chọrọ ka e weghachitere anyị Emeka Ihedioha, hoo haa!"

Mkpebi ụlọikpe kachasị gbasara ntuliaka oche gọvanọ Imo steeti tụrụ ọtụtụ ndị mmadụ n'anya.
Ọtụtụ na-ekwu na ya bụ ikpe bụ ọgbaraigbogharịị, ebe ndị ọzọ na-ekwu na ọ dabara adaba.
Mana ka o si kwụrụ ugbu a, ọ dị ka Hope Uzodinma ọ ga-abu gọvanọ Imo steeti ruo afọ 2024.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:










