Hope Uzodimma abụrụla Gọvanọ nke isii n'Imo steeti

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Skip Facebook post, 1

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 1

Uzodimma aṅụọla iyi ọrụ n'ụbọchị ncheta ndị agha Naịjirịa

Ugbua ka Hope Uzodimma bụrụ Gọvanọ nke Imo steeti.

Rochas Okorocha, aka chịburu Imo steeti, Uche Nwosu, Ifeanyi Araraume na Adams Oshiomole socha ndị bịara ịṅụ iyi Gọvanọ Uzodimma ndị bịara.

Ihedioha efeela ndị Imo aka

Ebe foto si, Ihedioha twitter

Nkọwa foto, Ihedioha ji ihu ọchị fee ndị Imo aka

Emeka Ihedioha, aka chịburu Imo Steeti arịọla ndị Imo ka ha kwadoro ọchịchị Hope Uzodinma.

Ihedioha kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara na mgbede Wenezde.

Ihe Ihedioha dere maka nchutu ya

Ebe foto si, Ihedioha/web

O kwuru na mkpebi ụlọikpe kachasị nyere gbasara ntuliaka ọkwa gọvanọ Imo steeti tụrụ ya n'anya nke ukwuu.

Ihedioha kwukwara na ya ekwenyeghi na mkpebi ahụ n'ihi na ọ bụghị ikpe kwụ ọtọ n'anya ya.

Ihe Ihedioha dere maka nchutu ya

Ebe foto si, Ihedioha/web

Mana ka o sina dị, o kwuru na ya na osote ya bụ Gerald Irona ga erube isi na mkpebi ahụ.

O kwuru sị: "Arịrịọ m na-arịọ ụnụ (ndi Imo) bụ ka ụnụ kwadoo ọchịchị onye bịara ịnọchi m, dịka ụnụ si kwadoo m."

"Ana m arịọ ndị nkwado anyị ka onye ọbụla dere jụụ ghara ime ihe ọbụla ga-ebute ọgbaaghara."

Ihe Ihedioha dere maka nchutu ya

Ebe foto si, Ihedioha/web

Ihe Ihedioha dere maka nchutu ya

Ebe foto si, Ihedioha/web

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

INEC enyela Uzodinma asambodo ọchịchị ya

Hope Uzodinma

Ngalaba na-ahazị ntuliaka na Naịjirịa bụ INEC enyela Hope Uzọdịmma asambodo dịka Gọvanọ Imo steeti.

Nke a na-eme dịka a na-akwado idu Uzodimma n'iyiọrụ n'Owere, isi obodo Imo steeti na mgbede Wenezde.

Skip Facebook post, 2

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 2

Idu n'iyiórú Hope Uzodinma

Ụlọikpe Kachasị nọrọ ụbọchị Tuzde nye mkpebi ghọrọ ọ gbara Igbo gharị dịka ha nyere Uzodima mmeri n'ikpe onye bụ gọvanọ Imo steeti na ntuliaka 2019 ma, nye iwu ka Ihediha hapụ ọkwa ahụ ozigbo.

N'etiti ehihie Wenezde, igwe mmadụ kụnyere ndị nze na ọzọ, ndị ndọọndọrọ ọchịchị, otu ụmụnwaanyị gbakọrọ n'ama "Hero Sqaure maka mmemme idu n'iyiọrụ, Uzodinma.

Ndịagha zọọ iji dịka ndị ọgụ ma were egwu ha merụba ụbọchị.

Ndị mmadụ ka na-ekwu okwu gbasara mwepụ ụlọikpe kachasị na Naịjirịa wepụrụ Emeka Ihedioha ma tinye Hope Uzodinma dịka gọvanọ Imo steeti.

Idu n'iyiórú Hope Uzodinma

Ebe ụfọdụ na-ekwu na ha aghọtaghị etu Uzodinma bụ onye gbaburu onye anọ mgbe a gụkọrọ vootu si bụrụ onye mbụ ugbua, ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ amụma Fada Mbaka buru n'isi ya mezuru.

Lee ihe ha kwuru:

Ndị otu PDP kwuru ka ọ ha ha n'ọnụ

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Femi Fani-Kayode bụbu minista na-ahụ maka njem ụgbọelu, kwuru na ihe a bụ ọgbara Igbo gharịị.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Skip X post, 4

End of X post, 4

Ndị Igbo agaghị arịọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa arịọ

Skip Facebook post, 3

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post, 3

Ichie Nduka Eya bụ otu onye so na ndị agha Biafra ekwuola na ndị Igbo agaghị arịọ arịọ ka e nye ha ọchịchị Naịjirịa.

Eya kwuru nke a na mkparịtaụka BBC Igbo nwere ụbọchị Wenezde iji cheta afọ iri ise agha Biafra bechara.

O kwuru na ọkwa onyeisiala Naijiria n'afọ 2023 bụ ndị Igbo ka o ruru n'aka.

Eya gakwara n'ihu rịọ ndị ntorobịa Igbo ka hapụ tigbuo zọgbuo ma were akọnuche n'okwu gbasara etu Biafra ga-esi nwere onwe ya.

Nkwụsị agha Biafra

Ojukwu

Ebe foto si, AFP

Taa bụ ụbọchị iri na ise nke ọnwa Jenụwarị afọ 2020, mere ya afọ iri ise kpọmkwem agha Biafra na Naịjirịa biri.

BBC Igbo nwere ọtụtụ akụkọ dị iche iche si n'ọnụ ndị o metụtara, ndị hụrụ nakwa ndị so lụọ agha a.

Gụọ maka ya n'uju ebe a:

Ndị gọọmentị Rọshịa agbaala arụkwaghị m

Onyeisiala Rọzhịa bụ Vladmir Putin na Praịm Mịnịsta Dmitry Medvedev

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Onyeisiala Rọzhịa bụ Vladmir Putin na Praịm Mịnịsta Dmitry Medvedev

Ndị isi gọọmentị mba Rọshịa agbaala arụkwaghịm dịka onyeisiala Vladmir Putin na-atụ alo ịgbanwe akwụkwọ iwu mba ahụ.

Praịm Minista Dmitry Medvedev kwuru na ihe ahụ Putin na-akwado ime ga-agbanwe ọnọdụ ọchịchị mba ahụ nke ukwu.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

Cheta na Putin emeriela ntuliaka ọkwa onyeisiala Rọshịa ugboro anọ.

Dịka iwu obodo ahụ si dị, ọ gaghị enwe ike ịzọ ọchịchị ọzọ ma ọ nọchaa nke a.

Ọchịchị ya nke ugbua ga-abịa n'isi njedebe n'afọ 2024.

N'Amerịka

Ụgbọelu na-aawufu mmanụ ụgbọelu

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ụgbọelu na-awufu mmanụ ụgbọelu

Ihe ruru mmadụ iri isii gụnyere ụmụakwụkwọ na-anata ọgwụgwọ maka mgbakasị akpụkpọ ahụ ha n'ụlọọgwụ dị n'obodo Cudahy dị na Los Angeles na mba Amerịka.

Ihe butere nke a bụ otu ụgbọelu Delta Airlines wụsara mmanụ ụgbọelu ya n'elu ụlọakwụkwọ ahụ dịka ọ na-achọ ụzọ o si efetu n'ọdọụgbọelu LAX, ka injin ya nyewere nsosgbu.

Serena Williams

Serena Williams

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Serena Williams

A na-atụ anya na Serena Williams ga-ebuli iko 'grand slam' nke iri abụọ na anọ ya mgbe asọmpi tenis 'Australian Open' ga-ebiri ọkụ.

Asọmpi a ga-ebido n'abalị iri abụọ nke ọnwa Janụwarị ruo abalị abụọ nke ọnwa Febụwarị.

Lukaku

Romelu Lukaku

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Inter Milan ji paụnd nde 74 zụta Romelu Lukaku n'aka Manchester United n'afọ 2019

Ọ dịkwa ka Romelu Lukaku nọ n'ofe ugbua, dịka o nyerela Inter Milan goolu na-erughi otu nkeji ha na Cagliari zutere n'asọmpi Coppa Italia.

Goolu abụọ o nyere iji mee ka Inter were ọkpụ anọ a satara otu merie, emeela ka ọ bụrụ nke iri na asatọ ọ na-enye n'ime egwuregwu iri abụọ na ise ọ na-agbara ha.

Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri a gbasara etu agha Biafra si bido ga-amasị gị:

Aha onyonyo, O meela afọ 50, a lụrụ Biafra, mana ihe kpatara ya ka na-eme