2020 Prophecies: Ihe PDP sara Mbaka gbasara amụma 2020

Emeka Ihedioha, Fada Mbaka na Hope Uzodimma

Ebe foto si, Facebook

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

"Mbaka ọ bụ ọkaikpe? Mbaka ọ bụ 'Supreme Court'? Ọ bụ sọ Mbaka bụ onye amụma Chineke na-agwa okwu?"

Nke a bụ ajụjụ Damian Opara bụ ọnụ na-ekwuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' nke Imo steeti na-ajụ.

Opara jụrụ ajụjụ a gbasara amụma afọ ọhụrụ nke Mbaka buru.

Emeka Ihedioha

Ebe foto si, Emeka Ihedioha/Facebook

N'amụma ahụ, Mbaka kwuru na Hope Uzodimma ga-eweghara ọchịchị n'aka gọvanọ Emeka Ihedioha n'oge adịghị anya.

Mbaka kwuru na ọ bụ Uzodimma bụ olileanya ndị Imo steeti.

Hope Uzodinma ji aha APC zọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti na ntuliaka 2019

Ebe foto si, Hope Uzodinma/Facebook

Nkọwa foto, Hope Uzodinma ji aha APC zọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti na ntuliaka 2019

Cheta na Uzodimma so wee zọọ ọkwa gọvanọ ime n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC mana ọ dara.

O mechara buru okwu ahụ gaa ụlọikpe ma dakwaa ọzọ.

Aha onyonyo, 2019 Elections: Buhari adaghị ntụliaka n'Enugu edere ya ede - Mbaka

Na mkparịtaụka ya na ndị BBC Igbo n'ụbọchị Tọzde, Opara kwuru na amụma ahụ Mbaka buru enweghị isi.

O kwuru sị: "O doro anya na Mbaka bụ onye otu APC."

"Ọ kwụnyere Buhari megide ndị Igbo na ntuliaka niile e merela."

"Mana amụma ya abụghị eziokwu n'ihi na ụlọikpe 'Supreme Court' ekpebiela ikpe ahụ.

Aha onyonyo, Imo state: 'A chọrọ m ka Ihedioha megharịa ihe niile Rochas mebiri '

Opara kwuru na ndị PDP nakwa ndị Imo steeti niile kwụ Gọvanọ Ihedioha n'azụ.

O kwukwara na amụma Mbaka anaghị echu ha ụra n'ihi na ọ bụghị naanị ya bụ onye amụma Chineke na-agwa okwu.

Amụma Mbaka buru maka afọ 2019

  • Mbaka sị na 2020 ga-abụrụ Naịjirịa afọ mgbanwe.
  • Ọ sị na a ga-enwe ọtụtụ ihe ịtụnanya n'ọchịchị gọọmenti na Naịjirịa ma n'etiti ma na steeti ga-emetụ onye ọbụla ruo ọkpụkpụ.
  • O buru amụma na mgbanwe ga-abịa n'ochichi Imo steeti n'afọ 2020. Ọ sị na Chukwu ga-ehicha ndị Imo steeti anya mmiri.
Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ekeresimesi oge ọchịchị Rochas ọ ka nke Ihedioha mma?