Amaka Igwe: Ihe iri ị na-amaghị maka nwaada Igbo a larala mmuọ

Ulọọrụ 'google' tinyere onyonyo Amaka Igwe n'ihu ọba ozi ha

Ebe foto si, Google

Nkọwa foto, Ulọọrụ 'google' tinyere onyonyo Amaka Igwe n'ihu ọba ozi ha n'ụbọchị Tozde
    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Taa ka Amaka Igwe gaara agba afọ iri ise na asaa, mana ọnwụ ekweghi.

Amaka Igwe nwaada Igbo soro hibe Nollywood

Ebe foto si, Charles Igwe/Facebook

Amaka bụ nwaada Igbo ji eme ọnụ, onye e ji ime ihe nkiri wee mara.

Aha onyonyo, Vicky Nwogu

Ọ bụ otu onye n'ime ndị mere ka mmepụta ihe ejije na Naịjirịa kwụrụ chịm dịka ọ dị taa.

Ụlọọrụ 'Google' tinyere onyonyoo Amaka Igwe n'ihu ọba ozi ha na Naịjirịa n'ụbọchị Tọzde iji kwanyere ya ugwu.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Ihe onyoonyo Amaka Igwe mere a kpọrọ Violated 2

Ebe foto si, Charles Igwe/Facebook

Lee ihe ndị pụtara ihe maka ndụ ya bụ agbara nwaanyị:

  • Ezigbo aha ya mgbe ọ nọ n'agbọghọ bụ Uzoamaka Audrey Ene mana aha di ya bụ Charlse Igwe. Ha lụrụ n'afọ 1993
  • Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndịrị n'Enugwu wee gaa mahadum na Mahadum Ile-Ife nke e ji 'Obafemi Awolowo University' mara ugbua
  • Tupu ọ malite ide nakwa ịhazi ejije, ọ kụrụ ọkpọ, tụọ bọọlụ nkata ma gbakwaa egwu atịlọgwụ
  • Ọ chọburu ịgụ akwụkwọ ndị ọkaiwu, mana ka o lechara ule 'Jamb', ihe ọ gụziri bụ Nkuzi Okpukperechi (Education/Religious Studies). O mechara gaa Mahadum Ibadan wee nweta nzere 'Masters' na nhazi ọba akwụkwọ (Library and Information Science)
  • O bụ ezigbo onye ụka Kraịstị. Oge ọ na-efe ala nna ya, ọ bụ ode akwụkwọ otu 'Scripture Union'
  • Ọ bụ Amaka Igwe wepụtara ihe ejije 'Rattle Snake' na 'Violated'
  • O mepụtakwara ihe nkiri 'TV' dị icheiche nke gụnyere 'Checkmate' na 'Fuji House of Commotion'
  • N'afọ 2011, o ritere nzere 'Member of The Federal Republic' (MFR) bụ nke a na-enye ndị tozuru etozu na Naịjirịa
  • Ọ nwụrụ n'ihi ọrịa 'asthma' n'afọ 2014
  • Ọ mụrụ ụmụ atọ tupu ọ laa mmụọ.
Rattle Snake

Ebe foto si, Charles Igwe/Facebook

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Lee emume mgba ndị Imerienwe