Game of Thrones: Ihe onyonyo anọ wuru ka ya na Naịjiria

Ebe foto si, Getty Images
Game of Thrones bụ ihe onyonyo a ma ama na mbaụwa niile nọzi n'agba nke ikpeazụ ya ugbua.
Ya mere mmadụ niile jiri kpụrụ ya bụ ihe onyonyo n'ọnụ kemgbe izuụka ole na ole gara aga.
GOT bụkwa aha ọzọ e ji mara ya bụ akụkọ, kpuchiri mba asaa na-azọ ocheeze igwe, na ogbugbu na mpụ so ya.
Akụkọ a ga-elebanye anya n'ihe onyonyo ise wuru ewu na Naijirịa ka GOT.
1. THINGS FALL APART

Ebe foto si, Screenshot/Youtube
Ọ bụ n'afọ 1986 ka ụlọ mgbasa ozi NTA mepụtara akwụkwọ Chinua Achebe bụ "Things Fall Apart" dịka ihe onyonyo.
Kemgbe afọ ahụ, o bidoro iwu ewu rue ugbua maka etu ndị mmadụ si hụ ya n'anya.
Ọ bụ n'ihe onyonyo ahụ ka Pete Edochie, Nkem Owoh na ndị ọzọ siri chakee.
2. SUPER STORY
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 1
Akụkọ a si n'ụlọọrụ Wale Adenuga ji ndị mmadụ n'ọrụ kemgbe e mepụtara nke mbụ ya n'afọ 2001.
Ọ bụkwa abalị tọzde ka a na-egosi ya mgbe ahụ. O nweghi onye ọ naghị amasị n'ezinaụlọ, ma nne na nna ma ụmụaka.
Ọ bụ ebe ahụ ka aha "Toyin Tomato" siri pụta ma wuwe ewu.
3. CHECKMATE
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 2
Checkmate bụ ebe a ka Ego Boyo bụ (Ego Nnamani mgbe ahụ), Bob Manuel-Udokwu nakwa Francis Agu nọ chakee n'ihe gbasara ihe onyonyo.
Amaka Igwe nke nwụrụ anwụ bụ onye malitere ide ya ma hazie ya bụ ihe onyonyo kemgbe afọ 1986.
4. TALES BY MOONLIGHT

Ebe foto si, iStock
Ihe onyonyo a bụ ebe a na-akọrọ ụmụaka akụkọ ifo dị icheiche iji kuziri ha ihe dị mma.
Ọ bụ ebe elekere asaa kwa mgbede ụbọchị ụka ka o ji apụta n'igwe onyonyo mgbe ahụ.
Akụkọ ga-amasị gị:











