Notre Dame Cathedral: Ọkụ agbaala nnukwu ụlọụka Notre Dame
Akụkọ chara akwụ taa:
Ọkụ agbala ụlọụka Notre Dame Cathedral
Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na ọkụ amabeghị ihe butere ya enwurula n'ụlọụka Notre Dame Catheral dị na Paris, mba France.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndị ọrụ gọọmenti na-ekwu na o nwere ike ọ bụrụna ọrụ e ji n'aka ugbua n'ụlọụka ahụ kpatara ọkụ ahụ .
N'afọ gara aga, ụka Katọlik kporo oku ego iji were ruzie ụlọụka ahụ nke na-adakpọ adakpọ.
Otu ọnụ na-ekwuru ụlọụka ahụ bụ nke Katọlik kwuru na ihe niile na-agba ọkụ, o nweghị ihe ga-afọ."
Dịka ozi si n'ụlọrụ onyeisiala mba Francce pụta siri kwuo, onyeisiala ha bụ Emmanuel Macron agbahapụla ebe o kwesịrị ịga gawa ebe ihe mere.
A na-arụzigharị Notre Dame Cathedral nke nde kwuru nde ndị njem nleta na-aga ahụ kwa afọ kemgbe a chọpụtara na o nwere akụkụ ya gbawara agbawa.
Ihe ị maghị maka Notre Dame Cathedral
- Ọ nweghị ebe nkiri na France dịka Notre Dame ma ewepụ Eiffel Tower.
- Notre Dame adịrịlarị kemgbe agbata afọ 1200 dịka ọ gbara afọ karịrị narị asatọ
- Notre Dame anọọla na enweghị ihe mere ya n'Agha mba ụwa abụọ alụrụla
Ozubulu massacre:Ụlọikpe atọhapụla mmadụ abụọ so na ndị anwụchiri

Ebe foto si, Reuters
Ka anyị malite n'Anambara ebe ụlọikpe ukwu dị n'Awka tọhapụrụ mmadụ abụọ eboro ebubo na aka ha dị na ọchụ ahụ e gburu na St. Phillip Catholic Church Ozubulu.
Okaikpe ukwu bụ Jọstis Fidelis Aniukwu kwuru na ya ahụghị ihe gosiri na aka Chinedu Akpunonu na Onyebuchi Mbanefo dị na ya ọchụ e gburu na ụbọchị isii nke ọnwa August afọ 2017.
Ịmachị ndị ọgbatumtum

Ebe foto si, Chioma Obianinwa
Onyeisi ndị uweojii n'Enugu adọọla ndị ọgbatumtum aka na ntị maka ịda iwu etiri gbasara ịgba ọgbatumtum.
Ọzọ dịka ibe ya, cheta na mmachị ọgbatumtum ịgba ga-dị n'Enugwu steeti.
Kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Sulaiman Balarabe enyela ndị uweojii iwu ka ha nwụchie ndị na ada iwu ahụ ma kpachie ọgbatumtum ha ma kpụpụ ha ụlọikpe.
Idemmiri na Ghana

Ebe foto si, Getty Images
N'ofesi e, okeide mmiri sitere na oke mmiri zoro ụbọchị ụka na mba Ghana egbuola mmadụ ise ka ya bụ mmiri zochara naanị awa atọ.
Seji Saji bụ osote onye isiọrụ National Disaster Management Organisation gwara BBC nke a mgbe anyị gbara ya ajụjụ ọnụ.

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu, Manchester United akpọpụtala aha dike na dimkpa iri abụọ na abụọ bụ ndị ga-eso sọọ mpi Champions League ha na Barcelona ụbọchị Tuzde na-abịa.
Cheta na Barcelona ji otu ọkpụ nyụọ Manchester anya mgbe ha gbara nke agba nke mbụ.
Nkeji
Woods turu ugo Masters na Augusta National

Ebe foto si, Reuters
Nke mere ya iko mbụ na-abata ya aka kemgbe afọ 2008.
Onweghị tinye maọbu mwepụ ego n'abịa na mmanụ agbịdị

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị Naịjirịa sị gị dere juu makana ha ekpebibeghị ịwepụ atụmatụ Bekee kpọrọ fuel subsidy.
Gọọmentị sị na onweghị ihe ọbụla na-eme ga-akpata ka ewepụ ya ugbua.
Gwomgworo bu mmanụ agbịdị agbawala ka ogbunigwe na Gombe

Ebe foto si, @Followlastma
Mmadụ iri na abụọ nwụrụ ebe mmadụ iri na isii merụrụ ezigbote ahụ n'ihe mberede a.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Gombe bụ Mary Mallum sị na ọ bụ wa wa wa butere ihe mberede okporo ụzọ a.
Ndị agha Sudan na-anwụchịkọ ndị otu Omar al-Bashir

Ebe foto si, Reuters
Ndi agha napụrụ Omar al-Bashir ọkwa na mba Sudan amalitela ịnwụchịkọ ndị ya na ya so chịa mba ahụ.
Ndị agha Sundan mere nke a ka ha ka na-ekwekwa nkwa na ha agaghị achụpụ ndi na-eme ngaghari iwe na mba ahụ.











