Oge Okoye: Ihe mere mgbe ọ gara n'ụlọekpere Alph Lukau

Ebe foto si, @ogeokoye
Ihe na-ewu ewu ugbua bụ na Oge Okoye ome ihe onyonyo a ma ama na Naịjirịa agaala n'ụlọekpere Alph Lukau.
Otu onyonyo gosiri ebe ụkọchukwu ahụ na-eburu ya amụma gbasara ndụ ya.
N'ime ihe onyonyo na-efegharị, Alph Lukau gwara Oge Okoye na oge eruola ọ ga-eji mapụ ndị ụfodụ na ndụ ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Oge na-ebe akwa mgbe nwoke ahụ na-agwa ya okwu maka ụmụ ya nke mere na ọ malitere ịwunyi elu.
Alph Lukau bụ ụkọchukwu Alleluia Ministries International nke dị na mba Sawụt Afrịka.
Ụkọchukwu ahụ malitere ịwu mgbe ndị ụlọozu na mba Sawụt Afrịka kwuru na ha ga-akpụpụ ya ụlọikpe maka aghụghọ.
Ụfọdụ ndị mmadụ dịka ladyveev na-ajụ ihe Oge Okoye gara ebe ahụ ịme
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ebe ndị ọzọ dịka Director Flo na-ajụ ma Okoye a chọrọ ịmegharị aka ọrụ ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3









