Ndị ụlọozu South Africa chọrọ ịkpụpụ ụkọchukwu ụlọikpe maka 'ịkpọlite onye nwụrụ anwụ'

Ụkọchukwu Alph Lukau kwụ n'akụkụ akpati ozu, tụkwasị aka n'elu afọ nwoke o kwuru na ọ kpọlitere n'ozu

Ebe foto si, Alph Lukau/Facebook

Nkọwa foto, Ụkọchukwu Alph Lukau (yi uwe na-acha anụnụ anụnụ) na-ekwu na ọ kpọlitere ozu nwoke a
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Otu ndị ụlọozu nọ na mba Saụt Afrịka ekwuola na ha ga-akpụpụ otu nwoke kpọrọ onwe ya ụkọchukwu ụlọikpe maka ikwu na ọ kpọlitere mmadụ n'ọnwụ.

Ndị ụlọozu ahụ kwuru na a ghọgburu ha, iji mee ka ha sonye.

Ọtụtu ndị mmadụ katọrọ ihe "ịtụ n'anya" ahụ mere n'ihu ụlọụka Lukau dị nso n'obodo Johannesburg, ebe ọtụtụ ji ya mere ihe ọchị.

"Anyị ekwenyeghị na e nwere ihe ọbụla dịka ihe iribama", ka ngalaba na-ahụ maka omenaala, ofufe na asụsụ a kpọrọ "(CRL Rights Commission)" gwara ndị ntaakụkọ mba Saụt Afrịka.

CRL kwuru sị "Ha na-eji ihe iribama aghọgbu ndị mmadụ na-enweghi olileanya iji napụta ha ego".

Ha ghọgburu ụlọozu atọ

Ụlọozu atọ sị na aghọgbụrụ ha na chandum a nọ na-achọzị ụzọ ha ga-eji mee ka ha hicha aha ha.

Ụlọozu ndị a bụ Kingdom Blue, Kings & Queens na Black Phoenix agaala ụlọikpe ma kwuo na-eji ọtụtụ usoro ghọgbuo ha.

Ụlọụka ụkọchukwu Lukau bụ Alleluia Ministries International, asabeghị ajuju BBC jụrụ ha banyere okwu a.

Otu ụlọ ntaakụkọ akpọrọ Sowetan si na ulọụka ahụ ekwuagharịala okwu banyere mkpọlite n'ọnwụ ahụ, si no ọbụghị ihe mere, na nwoke ahụ ha sị nwụru anwụ ekụrịela tụpụ ebute ya n'ụloụka ha na obodo Kramerville.

Sowetan sị na ulọụka ahụ sị: "Pastor Lukau mezuru ihe ịrịbama Chukwu malitere,"

Ndị mmadụ na mba Saụt Afịrịka na-ekwu okwu maka ihe a mere ọfụma.

Ọ nwekere ndị banyere soshal midia ji ya bụ ihe eme akaja.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Presentational white space
Skip X post, 2

End of X post, 2

Presentational white space
Skip X post, 3

End of X post, 3

Presentational white space