Ndị ụka Ekwensu na-ewere Naịjirịa iwe

Church of Satan

Ebe foto si, Church of Satan archives

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ndụ ụka ekwensu nke kpọrọ onwe ha "Church of Satan" na Bekee akpọpụtala Naịjirịa maka na ndị ndu Naịjirịa na-akpọ aha onyeisi ha etu masịrị ha.

Onye kpasuru ha iwe ọhụrụ a bụ onye bụbụ mịnịsta na-ahụ maka ọrụ ụgbọelu bụ Femi Fani-Kayode, ebe o kwuru na osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osibanjo bụ 'Onyeozi Ekwensu."

Fani-Kayode dere n'akara twitter ya na osote onyeisiala Osibanjo enweghi ikike ikatọ ndị ụkọchukwu na-anaghị ekwu okwu megide mpụ na ha na-emejo ụka Kraịstị.

Ọ gara n'ihu kwuo na Osibanjo n'onwe ya rapụtakwara ndị ụka Kraịstị maka na ọ bụ onye ụkọchukwu.

Fani-Kayode nọ na-azaghachi Osibanjo bụ onye na-akatọ ndị ụkọchụkwụ Naịjirịa na ha anaghị akwado gọọmenti Buhari n'agha ọ na-ebuso mpụ.

Mana ọ bụ ihe Fani-Kayode kwuru mere ndị ụka Ekwensu jiri wee iwe.

Ihe ụka Ekwensu dere

Ebe foto si, @ChurchofSatan/Twitter

Ndị ụka ahụ azaghachibuola onyeisiala Muhammadu Buhari n'ozi o dere n'akara twitter ebe o kwuru na ndị na-awakpo ụlọụka bụ ndị ajọ ọrụ ekwensu.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ