Pope: Ụka Katọlik akatọọla ịma mmadụ ikpe ọnwụ

Pope Francis

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, N'oge gara aga Pope Francis kwuru megide ịma mmadụ ikpe ọnwụ

Pope Francis gbanwere nkuzi ndị Ụka Katọlik ka omegide kpamkpam atụmatụ ịma mmadụ ikpe ọnwụ agbanyeghi ihe ọbụla onye ahụ mere.

Nkuzi ndị ụka ahụ n'oge gara aga kwadoro ịma mmadụ ikpe ọnwụ n'ụfọdụ ihe onye ahụ mere.

Mana ugbua onyeisi ụka ahụ bụ Pope Francis kwuru na "ọ bụ ime mmadụ ihe ike nakwa mmetọ ugwu ruru mmadụ".

Oche eji ekegbu onye a mara ikpe ọnwụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụka Kraịst ga-agba mbọ ka akachapụ ịma mmadụ ikpe ọnwụ n'ụwa niile.

Pope kwuru na-ekwesiri inye mmadụ ohere nchegharị na Chineke bụ onye kere mmadụ dị njikere ị na-aba onye nwere nchegharị.

O kwuru na ụka Kraịst ga-agba mbọ ka akachapụ ịma mmadụ ikpe ọnwụ n'ụwa niile.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: