Ihe mere Igbo ji achụpụ mmadụ n'ajọ ọhịa

Ebe foto si, Getty Images
Gịnị mere Igbo jiri kpọ ajọ ọhịa ajọ ọhịa?
Ị mara na ajọ ọhịa ka nọrọ ruo ugbua n'ala Igbo?
Gịnị bụ ajọ ọhịa?
Ọkachamara n'ihe ọmụmụ gbasara Afrịka na asụsụ na Mahadum nke Lagos bụ Chiagozie Nnabuihe kọwara BBC Igbo na Igbo kporọ ebe a ọhịa mmụọ, ọbụghị ajọ ọhịa dịka ọtụtụ mmadụ na-akpọ ya ugbua.
Dịka Igbo siri were nkwenye, ọhịa mmụọ bụ ebe ha na-efe chi biri n'Ala. Ebe a burukwa ebe ha na-asụpụ onyeọbụla Ala bụrụ ọnụ.
Ala
N'ala Igbo Chukwu kachasị mkpa, mana mmụọ na-eso ya bụ Ala.
Nnabuihe kọwara na ala Igbo were nkwenye na Ala bụ mmụọ mụpụtara ihe nịịle dị n'ụwa.
Ala sọ njọ (njọ Ala bụ igbuọchụ)
Igbo were nkwenye na Ala, na-ahụ ihe niile, nke a pụtara na onweghi njọ ọbụla ị ga-ekpuchi n'anya ya.

Ala ga-akụ onye a ọrịa kpam kpam.
Lee ọrịa Ala na-akụ ndị mere ya njọ
- Ara
- Ekpenta (Leprosy)
- Afọ ọzịza
- Nzịza (Dropsy)
- Ibi(hernia)
Nnabuihe kọwara n'oge ahụ, o nweghị dibịa ga-anwa anwa ịgwọ ọrịa ndị a anyị kpọrọ aha.
Onye ọbụla were ụdị ọrịa kwesiri ikwupụta njọọ o mere kpamkpam tupu ọ nwụọ. Ọ bụrụ na ọ saghị asịsa njọ o mere, ha ga-asụpụ ya n'ọhịa mmụọ.
Ihe ndị ọzọ dịka ịkwa iko di maọbụ nwunye onye ọzọ, maọbụ ịmụ ejime nakwa ọrịa agwọta agwọta nwere ike imee ka Ala bụọ onye ahụ ọnụ.
Nsụpụ mmadụ abụghị njọ
Dịka Nnabụihe jiri kọwa, nsụpụ onye a bụ maka ịzọ isi ụmụ ya nakwa ezinaụlọ ya.

Ebe foto si, Getty Images
Igbo n'oge gboo nwere nkwenye na onye ọbụla nabatara onye a anabataala iwe Ala n'ezinaụlọ ya.
Ebe ka ọhịa mmụọ di n'ala Igbo ugbua
- Mkpa Mbaise n'Imo steeti
- Ogwugwu ọkụ n'ime Okija
- Mbitoolu ala ogbaga
- Ihiala
- Arusi Ọkịja
Omenala Igbo na-anwụ anwụ
Nnabuihe kwuru na ihe a bụ nke kachasị njọ na-eme ugbua n'ala Igbo.
O kwuru na: "Omenaala dị iche iche n'ala Igbo n'anwụ maka ụka Kraist batara n'ala Igbo, ndị mmadụ emetọọla ọtụtụ ọhịa mmụọ a, o nweghị onye na-atuzi egwu ọhịa a"
Akụkọ ga-amasị gị









