Ndị ndọrọndọrọ agba ọhụrụ jị soshal midia eru ndị ntorobịa

Ebe foto si, Kingsley Moghalu
N'afọ 2015, ndị ndọrọndọrọ ọchịchi na Naịjirịa hụrụ soshal midia ka ihe dị mkpa maka irute ndị ntorobịa ma hụ na ozi ha ruru ha aka etu ha si zipụ ya.
Mgbe ahụ, onyeisiala Naịjirịa bụ Mohammadu Buhari nwetere ezigbote nhazigharị n'aka ndị ntorobịa site n'ọrụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya nyere 'Red Media', bụ ụlọọrụ ndị ntorobịa abụọ; Chidi Jideonwu na Adebola Williams nwe.
Onyeisiala nọ n'ọchịchị mgbe ahụ bụ Goodluck Jonathan jikwara soshal midia mee ihe o ji agwa ndị ntorobịa okwu, nke mere ulọ ntaakukọ CNN jiri kpọ ya "Facebook President" n'afọ 2010.
Ugbua, ka ndị ndọrọndọrọ na-ahazị maka 2019, ụfọdụ n'ime ndị chọrọ ka atunyere ha dịka onyeisiala ebidola iji soshal midia eme ka ndị ntorobịa mata na ha zuru ka e mee.
Fela Durutoye, bụ onye na-azọ ọchịchị ịbụ onyeisiala were otu akara na-ewu akpọrọ #ADENINY nke nwaaafọ Charles Okocha wepụtara mee ihe ọchi na Twitter.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Kingsley Moghalu bụkwa onye ọzọ chọrọ oche onyeisiala wepụtakwara nke ya bụ ebe ya na onye otiegwu @falzthebadguy mere ebe ha na-agba egwu na-ewu a kpọrọ 'Shaku-shaku.'
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ihe ndị a na-eme ka ụfọdụ ndị a na anọghị na pati na-achị maọbu nke na anọghị gbakọtara mee nzụkọ ebe ha nwere mkparịtaụka maka etu a ga-eji mee ntuliaka nke 2019.
O nwebeghị ihe ekwupụtara maka nkata ha kpara na nzụko ahụ, mana Moghalu dere na Twitter na mkparịtaụka ha gara ọfụma.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
A mabeghị ma ndị mmadụ ọ ga-akwado ndị a, mana ha na agbali ike ha iweta ndị ntorobia na soshal midia.








