Ekiti: Fayose sị ihere kwesiri ime Buhari maka etu ntuliaka si gaa

Ndị na-agba ọkada
Nkọwa foto, Ndị na-agba okada na-ekwu na ha chọrọ ịtụgharị ndị na-achị ha
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

N'ihe gosiri na ikike ọchịchị agafeela n'aka onye ọzọ, ngalaba ndị na-ahụ maka ndị na-arụ ọrụ ụgbọala n'Ekiti steeti hazigharị ndị na-achị ha taa n'Ado Ekiti, isi obodo steeti ahụ.

N'ọnụ ụtụtụ taa, ndị na-anya ọgbatụmtụm eji "ọkada" mara wuchiri ebe dị icheiche ngalaba na-ahụ maka ha nwere ụlọ ọgbakọ wee chụpụ ndị isi niile ha sị nkwadoro aka na-achị steetị ahu bụ Ayodele Fayose.

Mgbe BBC ruru ọdọ ụgbọala dị na ebe akpọrọ "Old Garage" n'Ọja Ọba, Ado Ekiti, ndị ọhụru anọchịela ndị ochie.

BBC hụkwara ọtụtụ okoroọbịa ji osisi na ngwa ọgụ ndị ọzọ na okporo ụzọ.

Ààrẹ Buhari kí Fayẹmi kú oríire

Ebe foto si, Kayode Fayemi/Facebook

Nkọwa foto, Ààrẹ Buhari kí Fayẹmi kú oríire

Etinyela ndị nchekwa si uweojii na ndịagha n'ebe maka igbochi ọgbaghara nwereike dapụta.

Cheta na Kayode Fayemi bụbụrụ aka na-achị steeti ahụ, ma bụbụ minista na-ahu maka ihe a na-egwupụta n'ala, meriri Kolapo Olusola Eleka bu osote gọvanọ steeti ahụ ugbua na ntuliaka emere ụbọchị Satọde gara aga.

Feyemi zọro ọchịchị n'aka ndị All Progressives Congress (APC) ka Fayemi zọrọ ya n'aka ndị Peoples Democratic Party (PDP).

BBC gara Ekiti ịhụ etu ya bu ntuliaka ga-esi gaa, ma hụ na pati abụọ a bụ ndị aha ha na-ada ụda banyere n'ime ike ego maka ịzụta votu.

Ndị nkwado
Nkọwa foto, Ọtụtụ mmadụ na-anwụrị maka mmeri Faeyemi

Mana ugbua, ndị PDP ekwuola na ha anabataghị ntuliaka a. Ma kwuo na ha na-ahụ na ha nwere mmeri n'ikpeazu - bụ ihe ụfọdụ sị pụtara na ha ga-aga ụlọikpe ga zọọ mkpebi ya bu ntuliaka.

Ugbua na soshal midia aka na-achị steeti ahu bụ Ayodele Fayose na-ebe akwa ariri were ebo onyeisiala Naịjiria bu Mohammadu Buhari na aka ya di na mmeri emeriri osote ya.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ọ gakwara n'ihu jụọ ihe mere ndị mmadu emeghị aṅụrịghị mgbe ozi pụtara na Fayemi meriri.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Mana, BBC Yoruba hụrụ ndị mmadụ na-eme ngagharị aṅụrị ka ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Naijirịa bu INEC kwupụtara na Fayemi emeriela.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Ndị ntaakụkọ BBC gara ọrụ n'Ekiti kwukwara na ọkachasị udo bụ ihe chịrị na ntuliaka a, agbanyeghi na o nwere ebe obele ọgbaghara chọrọ ime, mana ndị nchekwa mere ngwangwa gaṅụọ ya bụ ọkụ.