Nigerian churches: Gịnị kpatara ndị Igbo ji agakarị ụlọụka ndị a?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
Ọ bụ maka na ọ bụ ndị Igbo hibere ụka ndị a ka e nwere ihe ọzọ kpatara ha ji agakarị ha?
Tupu ndị ọcha eweta ụka n'ala Igbo, ọtụtụ ndị mmadụ na-efe arụsị maọbụ ikpere 'Chi' ọmenaala nke ụfọdụ na-akpọ "ịgọ mmụọ".
Mgbe gboo, oge ụka ka batachara ala Igbo, ndị ụka na-agbakọta n'otu ebe, ebe ha na-anọ aka ụka, pụtara na onye ọbụla na-ama ibe ya, mana ugbua, ọ rara ahụ ịhụ ụdịrị ụka ebe ndị mmadụ ga-ama onye bụ onye, maka na ụlọụka bidoro na-amụbanye nakwa na-ekesa onwe ha gburugburu.
Ọtụtụ ndị Igbo ugbua bidoro mepee ụlọụka nke ha, ma nwee igwemmadụ na-abịa aka ụka ebe ahụ, mana ihe a na-ekwu maka ya ugbua bụ ihe ụlọụka ndị Igbo na-aka aga na Naịjirịa.
Ọ bụghị ihe e zoro ezo na ndị Igbo anaghị eji ofufe egwu egwu, nke a malitere n'oge ha na-ekpere 'Chi' omenaala, nke bụ na ọtụtụ ndị mmadụ nwere 'Ikenga' nke ha n'ime ezinaụlọ ha.
Ịga ụka mere ka ha na-achọkwa ihu Chineke etu ha si mara.
Ụka ndị Igbo na-agakarị
1. The Lord's Chosen Charismatic Renewal Ministry:

Ebe foto si, Lord's Chosen Facebook
Lazarus Muoka bụ onye hibere ụlọụka a n'ọnwa Disemba 2002. Ọtụtụ mmadụ ọkachasị ndị Igbo, na-aga ya, ma na-eme ihe ndị dị na ya (dịka ị bata Legọs n'igwe ma o nwee emume).
Ihe e ji mara ha bụ akwa na-enwuke enwuke, nke ha ji 'egbochi ihe ọjọọ'. Ụfọdụ nwere ike ịkpọ ha ụka ọgbara ọhụrụ.
Ha na-akpọ onwe ha 'Chosen army' maọbụ 'Chosen mopol' nke pụara ndị agha a họpụtara ahọpụta n'Igbo.
2. Christian Pentecostal Mission, CPM:

Ebe foto si, CPM Facebook
Obiora Ezekiel bụ onye hibere ụlọụka a n'afọ 1978. Nke a bụkwa ụlọụka ọzọ ndị Igbo na-agata ọnụ ha.
E ji 'Demon Bulldozer' maọbụ 'the Lord's General' mara ya.
3. Catholic:

Ebe foto si, Getty Images
E hibere ụlọụka katọlik nke mbụ na Naịjirịa bido n'oge 1840 gbadatawa, na Kaduna, Legọs nakwa Ọnịcha.
Ị jụọ ndị mmadụ, ọtụtụ ga-agwa gị na ọ bụ ndị Igbo kacha ekpe Katọlik na Naịjirịa. E ji "ndị ụka fada" nakwa ikpe 'rosary' maọbụ 'chaplet' nakwa iyi 'scapụla' mara ha.
Popu bụ onye na-achịkọta ha na gburugburu ụwa niile, ndị ụkọchukwu ha anaghị alụ nwaanyị.
Ị ma na ụlọakwụkwọ katọlik ebe a na-azụ ndị ga-echi fada (seminary) kacha n'ụwa niile dị n'Enugwu? A na-akpọ ya 'Bigard Memorial'.
4. Anglican:

Ebe foto si, Anglicancommunionawka.com
E hibere ụlọụka Anglikan nke ọtụtụ na-akpọ 'CMS' na Badagry dị na Naịjirịa n'afọ 1842.
Ọtụtụ ndị mmadụ ọkachasị ndị Igbo na-aga ụlọụka a.
Ọtụtụ n'ime ha emechaala bụrụ ụkọchụkwu, ma ka na-abụ ya ruo echi. Otu ebe o si dịrị iche na nke ụka katọlik bụ na ndị ụkọchukwu ha na-alụ nwaanyị ma mụọ ụmụ ma ha chọọ.
5. The Redeemed Evangelical Mission (TREM):

Ebe foto si, AFP
E hibere ụlọụka a n'ụbọchị anọ nke ọnwa Jenụwarị, 1981. Onye nwe ya bụ Mike Okonkwo.
Ọ gara ọtụtụ ụlọakwụkwọ na-akuzi maka ofufe, ma na Naịjirịa na mba ofesi.
Ọtụtụ ndị Igbo na-agakwa ụka a.
6. Watchman Catholic Charismatic Renewal Movement

Ebe foto si, VOWTV Facebook
Aloysius Chukwuemeka Ohanebo hibere ụlọụka a n'afọ 2000.
E ji izisa ozi maka "ọgwụgwụ oge" mara ya.
7. Ụlọụka ndị ọzọ
Ụlọụka ndị ọzọ ndị Igbo na-agakarị bụ Assemblies of God, Grace of God Mission, Living Christ Mission, Presbyterian, Methodist, nakwa ndị nke a na-akpọ nke "ọgbara ọhụrụ" dịka Redeemed Christian Church of God, Living Faith Church nke e ji 'Winners Chapel mara, wdgz.
Ihe mere ndị Igbo ji aga ha
BBC Igbo jụrụ ndị na-agụ ya ihe kpatara ndị Igbo ji aga ụlọụka ndị a, lee ihe ha kwuru ebe a:

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










