N'Anambra a gbaala ụlọụka ebe ụmụnwanne lụrụ onwe ha ọkụ

Ebe foto si, Getty Images
Ndị obodo ji iwe gbaa ụlọụka ọkụ n'Anambra ka ụkọchukwu gbachara otu nwoke a kpọrọ Chiadi Ezeibekwe, na nwagbọghọ nwanne ya akwụkwọ.
Ndị ntaakụkọ Nigerian Tribune kwuru na ihe a mere n'obodo Agba dị n'Ekwulobia, Anambra Steeti.
Ndị obodo sị na ọ bụ 'ihe arụ'.
"Na mmeghachị omume doro anya gbasara agbamakwụkwọ a, ndị ntorobịa obodo Agba hụtara agbamakwụkwọ a ka ihe arụ mụnyere ụlọụka,Shepherd of Dwelling Fullness of God Church, ebe agbara akwụkwọ a ọkụ."
Dịka ntaakụkọ kwuru, diọkpara umunne abụọ a gbara ha akwụkwọ, kpọpụta amaokwu akwụkwọ nsọ iji kwado omume ya.
Mana nke gbagọjuru mmadụ anya bụ ka nne di na nwunye a gwara ndị ntaakụkọ na omume nwa ya si n'akwụkwọ nsọ, tinye "Nwa m nwoke kwụrụ ụgwọ isi nwaanyị ka a chọrọ."
Akụkọ si n'igwe okwu social media gbasara ihe merenu kwuru na nke nwoke dị afọ iri abụọ na ise tunyere nwanne ya nwaanyị ime.
Akụkọ ga-amasị gị:









