Bride Price and Marriage list in Mbaise: Ihe ọ ga-eri gị ịlụ nwaagbọghọ ọma na Mbaise

Nwada na-ala di

Ebe foto si, Chris Okereke

    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist Igbo

A sị na nwoke hụrụ nwaanyị ọ ga-alụ hụrụ ezi ihe nakwa na mma nwaanyị bụ di ya.

Mana e nwere oge akụkọ na-ekwu na ego e ji alụ nwaanyị n'obodo Mbaise, Imo Steetị dị oke ọnụ ahịa.

O nweghi onye ma ebe akụkọ a malitere ma ọ bụ mgbe o bidoro na-efesasị.

O meela ka ụfọdụ ụmụnwoke na-agbara Mbaise ọsọ n'okwu ịlụ nwaanyị ma meekwa ka ụfọdụ ụmụagbọghọ Mbaise alụghị di.

Ịgbankwụ nwaanyị

Ebe foto si, Nem_Photography/Instagram

BBC Igbo sị ka o leba anya n'okwu a maara ma ọ bụ eziokwu na ịlụ nwaanyị dị oke ọnụ na Mbaise.

Ụfọdụ ndị lụrụ nwaanyị na Mbaise tinyere ọnụ n'okwu ma kọwaa etu ije ha si gaa n'ịlụ nwaanyị.

Ihe ndị lụrụ nwaanyị na Mbaise kwuru

Ogechi Duruji bụ onye Ezemeku dị n'Uguta, Imo Steetị sị na ọ lụrụ nwaanyị n'Ahiazu Mbaise Kamgbe afọ 2010.

Ogechi Duruji

Ebe foto si, Ogechi Duruji

Nkọwa foto, "Emefughị m nnukwu ego mgbe m lụrụ nwunye m" - Ogechi Duruji

Ọ kwuru na akụkọ a na-akọ banyere ịlụ nwaanyị bụ ezigbo asị ọcha maka na o ji onwe ya amatụ, na o mefughi nnukwu ego n'oge ahụ.

Ihe ndị dị n'akwụkwọ nwaanyị

Ọ sị na ego o ji n'aka mgbe ọ lụrụ nwaanyị erughi puku narị naịra abụọ (N200,000) ma ego akụisi nwaanyị na ihe ndị ọzọ so ya.

Duruji sị na otu ihe wutere ya n'oge ahụ agwụla puku naịra ise (N5,000) a nara ya maka ịjụ ajụjụ.

Akwụkwọ ịlụ nwaanyị

Ọ sị na ya ndị ọgọ kpara nke ọma na ha nabatara ego ihe ndị ji bịa lụọ nwa ha.

Otu nwoke ọzọ bụ onye Ekiti Steetị na-achọghị ka a kpọọ aha na-eme ihe ịlụ nwaanyị n'Ahiazu Mbaise kọwara ihe ndị dị n'akwụkwọ ya.

Akwụkwọ ịlụ nwaanyị

ụfọdụ ihe ndị dị n'akwụkwọ ya gụnyere; ego ụmụnna N16,000, otu krate mmanya staụt, krate mmanya beer atọ, sịga, ụtaba, mkpụrụ ọji 36.

Nke ụmụnwaanyị bụ N12,000, krate mmanya malt abụọ, efere ụgba na anụ anọ (ndị nwoke na nwaanyị), aṅara, osikapa, anụ na mmanya, ndị ntoroọbịa puku naịra ise N5000.

Akwụkwọ ịlụ nwaanyị

Ọ sị na ngụkọọ ego niile ọ ga-efu nwereike ịbụ otu puku narị naịra na puku iri anọ (N140,000).

Ihe nwafọ Mbaise kwuru

Otu onye ndu ọdịnala si n'obodo Eziudo dị n'Ezinihite Mbaise bụ Maazị Okenze Nnabugwu Festus sị na Mbaise niile nwere otu omenala n'ihe ịlụ nwaanyị.

Ọ sị na ihe gbapụtara ihe bụ na ọ bụ ụmụnna na ezinaụlọ nwe nwaanyị na-ekpebi ihe a ga-eji alụ nwa ha.

Ọ sị na ọtụtụ ezinaụlọ na-achọ ka a zụta ihe ndị n'akwụkwọ bụ nke a na-eke ụzọ abụọ, nye ụmụnna otu ebe nna nwaanyị ga-ewere otu.

Ụmụasa mara mma

Ebe foto si, BigHWedding/Instagram

Mana ụfọdụ ndị bịara ịlụ nwaanyị na-enye ego karịa ịzụta ihe ndị ahụ site na nkwerịkọta ezinaụlọ nkwa nwaanyị.

Nnabugwu sị na ihe ndị ahụ a ga-azụta maọbụ ego ole ha ga-akwụ anaghị egbochi mmadụ alụghị nwaanyị.

Ọ sị na ọ bụghị iwu na nwoke ahụ ga-emecha ihe niile dị n'akwụkwọ, na akwụkwọ ahụ maka ntuziaka.

Ọ gara n'ihu sị na ihe niile na-abụ site na nkwekọrịta nwoke chọrọ ịlụ nwaanyị na nna (ezinaụlọ) nke nwaanyị ọ chọrọ ịlụ.