Marriage Proposal: Etu ụmụnwoke si agbado nwaanyị taa na mgbe gboo

Ebe foto si, chimepixel Instagram
Ị kpaa onye okenye aka n'ọnụ gbasara etu ụmụnwoke si agbadọ nwaanyị ha chọrọ ilụ taa, onye okenye ahụ ga-asị gị na ụwa emebiela.
Ụmụnwoke oge a na-ahụ nwaanyị ha chọrọ ịlụ buru ụzọ mee enyi, oge ụfọdụ a kwaa iko ma tụọ ya ime tupu ha alarụọ ụlọ ga gwa ndị nwe nwa ebumnuche ha.

Ebe foto si, Pete Edochie Instagram
Mana ị ga-ama ụzụ kpụrụ gị ime ụdị ihe dị etu ahụ n'oge gboo.

Ebe foto si, Davido instagram
Ọtụtụ ihe ndị a agbanwela nke mere na ndị okenye na-apụta eti aka n'obi na ndị ntoroọbịa anaghị emeta ya cha cha, ọkachasị etu nwoke si agbado nwaanyị si ya lụba ya.
N'ụwa taa, nwoke na-esekpu ala arịọ nwaanyị ma jụọ ya ma ọ ga-alụ ya.
Otu onye tiri mkpu ahụ bụ onye a ma ama na-eme ihe onyonyo nke a na-etu Ọgadagidi, Pete Edochie.

Ebe foto si, Martins Nnaedozie
Edochie bere nwịị na ọ bụ arụ ka nwoke sekpuru ala rịọ nwaanyị si ya ma ọ ga-alụ ya. O kwuru hoha na nke ahụ abụghị etu e si eme ya n'ala Igbo.
O kwuru na nwoke ekwesighi ire ugwu ya ebe nwaanyị ọ chọrọ ịlụ nọ ime ụdị ihe ahụ.
Mana ajụjụ ọtụtụ ndị Igbo na-etolite etolite na-ajụ bụ kedụkwanụ etu e si agado nwaanyị n'ala Igbo.
Nwoke chọrọ ịlụ nwaanyị, ọ bụrụ na o jighi ọla sekpuru ala rịọ nwaanyị ma ọ ga-alụ ya etu anyị siri mụta n'aka ndị ọcha, kedụ ka ọ ga-esi mee ya?
BBC Igbo gbara otu onye okenye aha ya bụ Peter Ezembu ajụjụọnụ ịmata etu omenala si eme ya.
O kwuputara ụfọdụ ụzọ e si achọta nwaanyị a ga-alụ n'oge gboo.

Ebe foto si, Igbankwung
Ụzọ e si achọta nwaanyị
- Nkwa alụmdi na nwata nke Bekee 'Betrothal': Ezembu kwuru na ọ bụghị iwu na alụmdi na nwunye ga-abụ n'etiti okenye abụọ maọbụ ndị tolitere etolite. O kwuru n'oge gboo, nne maọbụ nna nwa nwereike ịhụ nwantakịrị si n'ezinaụlọ dị ya mma, ha aga kwee nkwa na nwa ha ga-alụ onye ahụ maọbụ e kwee nkwa na onye ahụ ga-alụ nwa ha oge ha tolitere.
- Ọzọ bụkwa na nwoke nwereike ịhụ nwaanyị dị ime kwubie na ọ bụrụ na ọ mụọ nwa nwaanyị, na nwa ya ga-alụ ya, e si etu ahụ kwe nkwa maka alụmdi ha n'ọdị n'ihu.
Mana n'okwu nke na-eme n'etiti ndị toro eto, Ezembu kọwara na mgbe gboo, nwoke anaghị agwa nwaanyị na ọ chọrọ ịlụ ya maka na ọ bụghị ya na-aga alụta nwaanyị ahụ n'aka ya, kama ọ bụ nna ya na ụmụnna ya ga-alụtara ya nwaanyị.
Nke ahụ mere na nwoke ahụ ga-ebu ụzọ gwa nna ya na o nwere nwaanyị ọ hụrụ.
Nna ya ga-akpọrọ otu onye ụmụnna ya ga na be nwaanyị ahụ ga gwa nna nwaanyị na o nwere ọrọma chara acha ha hụrụ n'ụlọ ha, ha chọrọ ịwọrọ, kọwaa etu nwaagbọghọ ahụ dị.
Ebe ahụ ka ha ga-amalite nna nwa ahụ ga-akpọpụta nwagbaghọ ahụ gwa ya na nwamadị ahụ chọrọ ịlụ ya ma o kwetara.

Ebe foto si, chimepixel Instagram
Nwa agbọghọ ahụ kweta, e tinyezie ụbọchị nwoke na ụmụnna ya ga-abịa.
Mana taa, nwoke hụ nwaanyị ọ chọrọ ịlụ, o buru ụzọ sekpuru ala, nye ya ọla jụọ ya ka ọ g-alụ ya, nwaanyị ahụ kweta, ha aga n'ụlọ ya gaa jụzie nne na nna ya.
Nke ahụ ka Edochie sịrị mba na ọ dịghị mma.
Mana ajụjụ bụ o nwere ihe ọjọọ dị na ya?
Ọ bụrụ ya bụ naanị otu oge nwoke ga-esekpuru nwaanyị ya ala, ọ dị njọ?
Ajụjụ a ka anyị jiri gakwuru Pete Edochie onye gbara isi akwara sị mbakwa, nwoke anwala ya anwa.
Mana omenaala bụ mmụta mmụta, i weta ebe a, i tinye ebe a, ụmụntoroọbịa Igbo anatala ndị ọha nke ahụ, ha kwukwara na ha ahụghị ihe ọjọọ ọbụla na ya.
Oge BBC Igbo jụrụ ndị mmadụ ihe ha chere gbasara ya na Facebook, ụfọdụ kwuru na ọ dị mma ebe ụfọdụ kwuru na ọ jọgburu udele sigbuo nkakwụ n'isi.

Ebe foto si, facabook
Otu ihe dị mkpa n'alụmdi na nwunye bụ nkwekọrịta dị n'etiti mmadụ abụọ ahụ. Etu ọbụla o si dị onye mma, ya mee makana omenaala na-agbanwe agbanwe. Nwa ntịị ebe a, nwa ntịị ebe a, ụnụ a na-aga.









