Male Contraceptives: A ga-agbawa ụmụnwoke ọgwụ mgbochi nwa - Ndị dọkinta

Ha ga-ebido gbawa ụmụnwoke ndụ mgbochi nwa

Ebe foto si, Reuters

Ka ọ kwụ ugbua, ndị dọkịnta n'India na-akọwa na ha arụpụtala ọgwụ ga-eme ka nwoke ghara ịtụwa nwaanyị ime mgbe ọ na-achọghị.

Ndị dọkinta a sị na enyochala ọgwụ a ma chọpụta na ọ na-arụ ọrụ ruo pacenti 97.3 ma kwukwa na ọ naghị enye nsogbu ọbụla n'ahụ.

Ha sị na ọ bụ onye ji asambodo ọrụ ọgwụgwọ ga-agbanyenwu ọgwụ a a na-agba n'akpa amụ onye chọrọ.

sperm

Ebe foto si, SCIENCE PHOTO LIBARY

Ya bụrụ na okwu ha wepụtara bụrụ eziokwu, ọ ga-abụ mbụ e nwere ọgwụ nwoke ga-aṅụ maka igbochi nwa.

Ụgbua, ọ bụ naanị ụmụnwaanyị nwere ọgwụ e ji egbochi nwa.

Ihe ụmụnwoke nwere ha ji egbochi nwa bụ okpu nna bụ enyị, bụ nke Bekee kpọrọ "condom", maọbụ ịmịpụ amụ tupu ha anyụpụ olulu.

Otu a kpọrọ "Indian Council for Medical Research" si na ọgwụ a adịla "njikere".

Nkọwa ha bụ na ọgwụ a agaghị egbochi nwoke ịtụ nwaanyị ime kpam kpam. Ha si na ọ ga-arụ ọrụ ruo afọ 13 ma bụkwara ihe ndị achọghị ka eme ha nke Bekee kpọrọ "surgical vasectomy" ga-eme.

Onwekwara mba ndi ọzọ na-achọ ịrụpụta ụdịrị ọgwụ a dịka Amerịka na Briten.

Maazi Sagay s ka atụọ Magu ugo

Magu

Ebe foto si, EFCC FACEBOOK PAGE

Nkọwa foto, Buhari họpụtara Magu ugboro abụọ ka ndị sineti were ya dịka onyeisi EFCC

Otu ndụmọdụ Onyeisiala Buhari n'ọkwu nrụrụaka akwadola ka e nyefe Ibrahim Magu na-arụ ọrụ dịka onyeisi EFCC ọkwa a n'uju.

Onyeisi otu a bụ Itse Sagay sị na Magu etinyela ụjọ n'ahụ ndị na-ezu akụnaụba Naịjirịa nke mere ha aripu ọsọ.

Magu agaala njem ntuzu ugo a ugboro abụọ mama ndị sineti gbajọrọ inye ya ohere ịgafe.

Ganduje du ndị APC aga njem ikpe udo n'Edo

Umar Ganduje

Ebe foto si, @DrAUGanduje

APC ahọpụtala gọvanọ Abdullahi Ganduje nke Kano Steeti na ndị ọzọ ka ha ga mee udo n'etiti ndị otu ha n'Edo Steeti

Cheta na ogbogbo nsogbu dị n'ime APC nke Edo Steeti n'ihi esemokwu dị n'etiti gọvanọ Godwin Obaseke na onyeisioche APC bụ Adams Oshiomole.

Obaseke chọrọ ịzọ ọkwa govano ọzọ, mana ọ dịka nna ya ukwu Oshiomhole achọghị.

Mourinho ekwekwala nkwa

Mourinho

Ebe foto si, Getty Images

Jose Mourinho ekwela ndị Tottenham nkwa iji ọnụnụ ọkụ na obi ụtọ arụ ọrụ ya dịka onye nchịkọta ha

Nke a ọ bụ nkwa a sị nwoke kwere nwaanyị n'elu akwa? A chọpụta ma egwu biri ọkụ.

Gee nkeji BBC ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ọkaikpe Nkemdilim Izuako