Security Votes: Magu kwesiri isekpu ala rịọ anyị mgbaghara- Ndị gọvanọ Ọwụwa-Anyanwụ

Onyeisi ọgbakọ ndị gọvanọ nke Ọwụwa-Anyanwụ bụ Dave Umahi ekwuola na okwu si n'ọnụ onyeisi EFCC bụ Ibrahim Magu nke na-ebo ndị gọvanọ ebubo ime 'dum-chụpụ, dum-chọọ' n'okwu nchekwa pụta bụ okwu ataghị eze nke o kwesiri ịrịọ mgbaghara maka ya.
N'ụbọchị Wenezde n'Abuja, Magu nọrọ n'ọgbakọ nkuzi e nwere maka ndị gọvanọ ọhụrụ na ndị na-alọghachite boro ebubo na ndị gọvanọ na-afụnye ọkụ na nsogbu nchekwa iji nweta ego pụrụ iche maka ọrụ nchekwa nke a kpọrọ "Security Vote" na bekee.

Ebe foto si, EFCC FACEBOOK PAGE
Ọ sịrị : "Anyị nwere ihe akaebe na-egosi na ụfọdụ ndị gọvanọ ji maka nsogbu nchekwa na-ezu ego ọha mmadụ."
Mana n'osịsa nke Govanọ Umahi nyere site n'ọnụ ọnụ na-ekwuru ya bụ Emmanuel Uzor, o kwuru na okwu Magu abụghị eziokwu.
"Ihe Magu kwuru abụghị ihe kwesịrị isi n'ọnụ onye ọrụ nchekwa pụta. O gosiri na Magu amaghị ọrụ ya."
"Magụ kwesịrị ịghọta ụbọchị onye ọbụla bụ gọvanọ na-ebinye aka n'akwụkwọ dịka gọvanọ, ihe ị " na-ebinye aka ichekwa ndụ na akụnaụba ndị obodo gị."
"O nweghị onye ọbụla ṅụjuru ara afọ ọ ga-amasị na ndị obodo ya na-anwụsịsị ka o were na-enweta ego."
Ọ gara n'ihu kwuo na Magu kwesịrị "igbu ikpere n'ala rịọ ndị gọvanọ maka ihe o kwuru adịghị mma."









