Lawal Musa Daura dara iwu ise ndị a nke butere ọchụchụ ya

Lawal Musa Daura

Ebe foto si, Nigerian Presidency

Nkọwa foto, Onyeisi DSS bụ Lawal Musa Daura rituru ugbua bụ onye a na-arụ aka na o so na ndị 'kabal' n'ọchịchị onyeisiala Buhari
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onye bụbụ onyeisi DSS bụ Lawal Daura bụ dike na-abara agụ mba were rute taa bụ Tudse egwu dagharịrị.

Onye na-arụ ọrụ dịka onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osibajo chụrụ Lawal Daura n'ọrụ nke mere ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na iko nwa amadị ahụ ejula.

N'uche ha, nwoke ahụ nke a na-ebo ebubo na oso na ndị nwunye onyeisiala Muhammadu Buhari na-arụaka dịka ndị na-enye ọchịchị dị ya ajọ aha akpọrọ 'Cabal'.

Lee ihe ndị tara ọjị anya a na-ebo ya ebubo:

1. Ndị ọrụ DSS ji egbe ma gbuchie ihu ha wakporo ụlọomeiwu jụ na ndị omeiwu agaghị abanye n'ọgba ụlọomeiwu n'ụbọchị asaa nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2018.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

2. Agbanyeghị na ọ bụ Buhari tinyere ndịisi DSS na EFCC n'ọrụ, Lawal Musa na-agba onye Buhari họpụtara ichi EFCC bụ Magụ mgba site n'idegara ụlọomeiwu akwụkwọ ebubo mpụ megide Ibrahim Magu.

3. DSS wakporo ụlọ ndị ọkaikpe itoolu n'ihi ebubo nrụrụaka n'afọ 2016.

Ndị mwakpo a metụtara gụnyere Jọstis Sylvanus Nwali Ngwunta; John Inyang Okoro, Dimgba Nnamdi, Muazu Pindiga, nakwa Adeniyi Ademola.

4. Aka Lawal Musa Daura dịkwa n'ọtụtụ ndị e jichiri n'okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị na-akpọpụghị ha n'ụlọikpe maọbụ na-egeghị mkpebi ụlọikpe ntị dịka El-Zakzaky, Dasuki, na Nnamdi Kanu bụ onye e mechara hapụ mana amaghị ebe ọ nọ kemgbe ọnwa Septemba afọ 2017.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

5. DSS nke Lawal Daura nọ n'isi ya bụkwa ndị wakporo nwafọ Igbo bụ Enyinnaya Abaribe n'ihi ebubo na ọ na-azụ ahịa egbe na ngwaọgụ ma na-akwadokwa otu Ipob.

Akara ntụ-ntụ

Ebe foto si, Nigerian Presidency

Akụkọ ndị ga-amasị gị: