Matthew Seiyefa: Ihe m ndị m ga-eme na DSS

Ebe foto si, NIPSS
Matthew Seiyefa bụ onyeisi ọhụrụ otu uweojii nzuzo Naịjirịa nke a kpọrọ Department of State Services (DSS) banyere n'ọkwa ya ụnyaahụ bụ Wenezde ekwuola na ngalaba ahụ ga-elebanya n'ebubo mmegide na mkpagbu eborola ụlọọrụ ha.
Seiyefa kwuru na DSS n'ọchịchị ya ga-akwanyere ikike dịrị ụmụ Naijiria ugwu.
O kwukwara na DSS dị njikere ka ha na ndị niile nsogbu nchekwa Naịjrịa metụtara jikọọ aka ma gboo ya bụ ọgụ.
Mana ọ gbara ama na ụlọọrụ ahụ agaghị asọ ngọngọ maọbụ nwe obi otiti nye onye ọbụla n'ọrụ ha.
"N'oge m, ụlọọrụ a gaakwanyere ikike dịrị ndị Naijiria ugwu dịka o kwesịrị, a weliteghị onye ọbụla karịa ibe ya maka ọdịmma ala anyị."
"Anyị dị njikere ka anyị na ndị niile okwu nchekwa metụtara ijikọta aka gboo ọgụ nsogbu chere ala anyị aka mgba.
Seiyefa gara n'ihu sị, "Anyị ga-elebanyekwa anya n'ihe ndị ahụ niile nyere DSS ajọ aha."
Cheta na n'ụbọchị Tuusde, n'ụzọ bịara na ntụmadị ma tọọkwa ọtụtụ ụmụ Naijiria ụtọ n'obi, onye na-arụ ọrụ dịka onyeisiala bụ Yemi Osinbajo chụrụ onye bụbụ onyeisi DSS bụ Lawal Daura n'ọrụ na mberede n'ihi mwakpo ụlọrụ ahụ wakporo ụlọomeiwu ma gbochie ndị ụlọomeiwu mmadụ tinyere Matthew Seiyefa n'ọrụ ụnyaahụ dịka onyeisi ndị uweojii nzuzo Naijiria.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Akụkọ ga-amasị gị









