Osita Okechukwu: Igbo wepụ uche na 'resturcturing'

Ebe foto si, Ebere Ekeopara
Onyeisi ụlọ mgbasa ozi Voice of Nigeria (VON) bụ Osita Okechukwu ekwuola na ọ kaara ndị Igbo mma ịchọwa onyeisiala 2023 karịa ịkwuwe okwu ihazigharị obodo Naịjirịa.
N'okwu ya, ịchụwa ọkwa onyeisiala nke 2023 ka nso karịa ị chọwa ka a ga-esi hazigharịa obodo Naịjirịa.
O kwuru na ọ fọro naanị afọ anọ ka onyeisiala Buharị chizuo.
Okechukwu bụ onye otu APC kwukwara na ọbụrụ na Igbo kwado Buharị, Buharị akwado Igbo n'ịnweta ya bụ ebum n'obi nke pụtara na onye keele Sunny, Sunny ekeele ya.
N'aka nke ọzọ Okpani Nkama bụ otu n'ime ndị ọnụ na-erụ n'okwu n'Ohaneze Ndigbo sara Okechukwu na "ọ bụ uche ya ka ọ na-akọ".
N'okwu ya "uche onye adịghị ya njọ".
Ọkpanị kwuru na ihe Ohaneze na ọrụ na Igbo kpụ n'ọnụ bụ ka a ga-esị hazigharịa obodo Naịjirịa nke ga-enye aka ka egbe bere ugo bere.
Otu onye ọnụ na-eru n'okwu na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ya agaghị ewetu onwe ya ala ịsawa Okechukwu okwu maka na ọ bụ ihe a tụrụ anya ka onye nọ na ọnọdụ ya kwuo ka a ghara ịchụ ya n'ọrụ.
Ọ rịọrọ BBC Igbo ka ha ghara ịkpọ aha ya maka na ọ achọghị itinye ọnụ na-ụdị okwu ahụ na-erijughị afọ.












