Komiti el-Rufai gụpụtala ihe ha chọpụtara maka okwu 'restructuring'

Nasir el-Rufai

Ebe foto si, Nasir el-Rufai/Facebook

Nkọwa foto, Nasir el-Rufai a gụpụtarala Onyeisi APC isiokwu dị na ihe nchọpụta ha mere maka "restructuring"
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị otu All Progressive Congress (APC), eweputala akwụkwọ isiokwu ha metere n'ọgbakọ gbasara ịmegharị ọchịchị obodo nke bekee kpọrọ 'restructuring'.

Onyeisi ndị otu pati ahụ hibere maka ị lebe anya na ya bụ atụmatụ bụ Nasir el-Rufai gụpụtara isiokwu dị na ya bụ akwụkwọ n'ihụ onye nchịkọta pati ha bụ John Odigie-Oyegun.

Dika nta akwụkwọ ThisDay siri kwu, , na akụ ndị ọzọ bụ ọnatarachi.

Mana ha sị na-aga ahapụrụ gọmenti etiti mmanụ agbidi nke di n'ime osimiri ka ha lekọtawa anya.

Kọmitịị ahụ kwetakwara na ọ dị mma ị hapụ steeti ọbụla ka ha wee ndị uweojii nke ha ma nwee ikike ị me ihe ụfọdụ nke ha eweghị ike ị me ugbua.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ha kwetakwara na ọ dị mkpa itinye ikike ga enye aka ka ndị mmadụ mee ntụliaka nke bekee kpọrọ referendum maka ihe ụfọdụ ndị ha mkpa.

Dika akwụkwọ ha sị kwuo, ọtụtụ mmadụ bụ ndị ha gbara ajụjụ ọnụ ekweteghị na ọ dị mkpa ị kewepụta steeti ọzọ n'ebe ọbụla, kama ha sị na steeti ọbụla kwekọrịtara nwere ike i jikọta ọnụ bụrụ otu.

Na nke ya, nta akụkọ The Sun sị na otu Comitii a tinyere ọnụ n'isiokwu dị iri abuo na anọ (24) bụ ihe dị ndị Naịjirịa mkpa ma kwekọrịta na iri na atọ (13).

Akwụkwọ ahụ kwetakwara na-ọdị mkpa ị hazigharị otu esi eke ego na Naịjirịa.

Ndị kọmitịị a zukọrọ ugboro iri na anọ (14) ebe ha gbara ihe ruru mmadụ puku asatọ na iri-anọ (8,040) ajụjụ ọnụ na-Naịjirịa.

Ndị kọmitii rụrụ ọrụ a dị iri abuo na atọ (23), mana ha dịbu nanị iri (10) na mbụ.

Akara ntụ-ntụ

Isi okwu asatọ dị na akwụkwọ nchọpụta a

Logo APC

Ebe foto si, APC

  • Steeti ga enwezi akụ na uba ọnatarachi dị n'ala, mana ndị nọọ n'ime osimiri esoghị.
  • Ndị ọbụla ga enwe ndị uweojii nke ha.
  • Aga etinye ikike ga enyere ndị mmadụ aka ị me ntuiliaka maka ị nwere onwe ha ma ọbukwanụ ihe ndị ọzọ dị ha mkpa.
  • Akwụkwọ ahụ a kwadoghị gọmentị ị ke steeti ọzọ mana ọkwadọrọ steeti ndị chọrọ ijikọnụ kwekọrịta bụrụ otu.
  • Aka akpatụ na aka iwu nyere ikike ị gwupute akọ dị n'ala, ụtụisi mmanụ agbidi na ị ke ma ọbụ i jị ala rụọ ọrụ.
  • A ga akpatụkwa aka n'iwu metụtara ka-esi eke ego oha.
  • Ogbụrụ ọchịchị nke Lokal gọmentị ga akwụdoro onwe ha
  • O tinyere ọnụ maka ndị mmadụ n'esoghị na pati soro na ndọrọndọrọ ọchịchị, mana ha enweghị nkwado ndị mmadụ na nkea ahụ.
Akara ntụ-ntụ