2019 Election: Lee ụmụafọ Igbo uche ha dị n'ọkwa onyeisiala

Dịka ọfọdụrụ ọnwa isii ka-eme ntuliaka onyeisiala nke afọ 2019, ọtụtụ ndi ndọrọndọrọ ọchịchị ekwupụtala uche isonye zọọ ya bụ ọkwa.
Ndị a gụnyere onye na-achị ugbua bụ Buhari na ndị si na pati dị iche iche nakwa mpaghara Naịjirịa dị iche iche.
Cheta na ọtụtụ ụmụ Igbo na-eti mkpu na ana-emegbu ha nke mere otu dịka IPOB, MASSOB, BIM, BZM, BZF na ndị ọzọ chọrọ mwereonwe.
Ebe otu ndị dịka Ohanaeze Ndigbo, Igbo Leaders of Thought na ndị ọzọ chọrọ ka aghazigharịa ọchịchị Naịjirịa.
Agbanyeghi nke a, ụfọdụ ụmụ Igbo agaala n'ihu n'igosipụta ebumnobi ha iso zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2019.
Ụfọdụ n'ime ndị a gụnyere;
Kingsley Moghalu:

Ebe foto si, Kingsley Moghalu/Facebook
Kingsley Moghalu bụ nwafọ Igbo si na Nnewi dị n'Anambra steeti, gbara afọ iri ise na ise.
Ọ bụ onye ọkaikpe nakwa onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara akụnaụba, ọ bụbu osote gọvanọ ụlọọbaego ukwu ala Naịjirịa.
Enyinnaya Nnaemeka Nwosu:

Ebe foto si, Enyinnaya Nnaemeka Nwosu for president/Facebook
Enyinnaya Nnaemeka Nwosu bụ nwafọ Igbo si n'Umuahia dị n'Abia steeti.
Ọ bụ onye ọkaikpe, onye nkuzi nakwa ọnye ọrụ ụlọakụ.
Eunice Atuejide:

Ebe foto si, Eunice Atuejide
Eunice Atuejide bụ nwada Igbo si n'Igbo Etiti dị n'Enugwu steeti, gbara afọ iri atọ na itoolu.
Ọ bụ onye ọkaiwu n'ụlọikpe Suprim nke Naịjirịa, bụrụkwa onye ọchụnta ego.
Yul Edochie:

Ebe foto si, yuledocie/instagram
Yul Edochie bụ nwafọ Igbo sị n'Anambra Steeti, nwa nwoke onye ome ihe nkiri bụ Pete Edochie. Ọgbara afọ iri atọ na asatọ.
Ọ bụ ome ihe nkiri, bụrụkwa onye ndụmọdụ pụrụiche nke gọvanọ Anambra steeti bụ Willie Obiano.
Charles Udeogaranya:

Ebe foto si, Charles Udeogaranya/facebook
Charles Udeogaranya bụ nwafọ Igbo gbara afọ iri anọ na isii.
Ọ bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị pati APC, ọ bụbu onyeisi oche pati African Renaissance ngalaba Legọs.
Chike Ukaegbu:

Ebe foto si, Chike Ukaegbu/Instagram
Chike Ukaegbu bụ nwafọ Igbo amụrụ n'Owerri dị n'Imo steeti, gbara afọ iri atọ na ise.
Ọ bụ onye ọchụnta ego n'ihe gbasara technụzụ, bụrụkwa onye ode akwụkwọ nakwa onye nkwalite ndị ntoroọbịa.
Ndị ọzọ gụnyere Omike Chikeluba Lewis, Festus Obeghe.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:











