National assembly: Ihe nkiri na-eme n'ụlọomeiwu sineti ka kpụkwa ọkụ n'ọnụ.

Saraki na Ekweremadu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Otu dị iche iche aputala ị kwu na ha akwadoghị nchutu Saraki na Ekweremmadu

Ndị sịnetọ ruru iri anọ n'itoolu e binyela aka n'akwụkwọ iji hụ na achụtughi ndịisi ụlọomeiwu ukwu nke Naịjirịa.

Ọtụtụ ndị sịnetọ si na otu ndọrọndọrọ ọchịchị akpọrọ PDP so na ndị binyere aka n'akwụkwọ a.

Akwụkwọ ahụ gụpụtara ihe ndị a,"Anyi bụ ndị sinetọ binyere aka n'akwụkwọ a na-ekwupụta oke nkwado anyi na-ebe onyisi ụlọomeiwu ukwu bụ Saraki na Ike Ekweremadu dika ndị isi anyị.".

"Anyị e kwenyeghị na nchụtụ ọ bụla ụfọdụ ndị otu anyi na-akwado ime ha.''

Cheta na akụkọ kwuru na ụfọdụ ndị sinetọ otu patị APC na-akwado ị chutu Saraki and Ekweremadu mana ndị sinetọ otu patị PDP nụchatara ya ma gba mbọ n'agbanyeghị na ha nọ ezumike bịa ghasasia ya bụ nzụbe.

Ihu ụlọomeiwu, National Assembly

Ebe foto si, Olu Onemola

Nkọwa foto, Ndị fụrụ ekpo na-egbochi ndị mmadụ ịbanye n'ụlọomeiwu Naịjirịa

Na mbụ, ndị ọrụ nchekwa akpọrọ DSS kpuchiri ihu ha ekweghị ka ha banye n'ụlọọrụ ha mgbe ndị sinetọ APC zukọrọ mana ha mechara banye.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: