Fayose asaala EFCC: Egwu ihe ga-eme echi anaghị atụ m

Ayo Fayose

Ebe foto si, @GovAyoFayose

Nkọwa foto, Ayo Fayose ga-aritu n'ọkwa Gọvanọr n' abalị 15 nke ọnwa OỌktoba afọ 2018
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Gọvanọ Ekiti steeti bụ Ayo Fayose ekwuola na EFCC itinye aha ya n'akwụkwọ ndị a na-achọ achọ bụ agwa ụmụaka.

EFCC degara ụlọọrụ gọọmenti na-echekwa agbata Naịjirịa na mba ndị ọzọ nke a kpọrọ 'Nigeria Custom Service' (NCS) akwụkwọ ka ha gbochie aka na-achị Ekiti steeti bụ Fayose ịgafe mba ọzọ site n'elu, ala maọbụ oke osimmiri.

N'akwụkwọ ozi onyeisi EFCC bụ Ibrahim Magu degara Kọstọm n'abalị iri na abụọ nke ọnwa Septemba, o kwuru na a na-enyocha Fayose nakwa na a na-atụ uche na o nwere ike ịgbapụ n'ala Naịjirịa iji gbalahụ nyocha.

Kọstọm nabatara ozi ahụ ma gbasaa ya n'ụlọọrụ ha niile dị na mpaghara dị iche iche, wee gwa ha ka ha mụrụ anya dịka azụ n'inyo nwa amadị ahụ ma wetara EFCC ozi ma ọ bụrụ na anya ha hụ Fayose.

Cheta na n'izu gara aga, Fayose degachara ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka akwụkwọ ozi, gwa ha na ya ga-awụchi n'ụlọọrụ ha n'abalị iri na isii nke ọnwa Ọktoba.

Abalị iri na ise nke ọnwa Ọktoba bụ ụbọchị Fayose ga-aritu n'ọkwa dịka gọvanọ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ka ọ dị ugbua, Fayose asaala EFCC si na ha itinye aha ya n'akwụkwọ ndị a na-achọ achọ abụghị naanị ndorondoro ọchịchị kama ọ bụ agwa ụmụaka.

Fayose kwuru n'akara Twitter ya sị, "Egwu anaghị atụ m maka ihe ga-eme echi. O nweghi onye bụ Chukwu. Ha tuwa anya m n'abalị iri na isii nke ọnwa Ọktoba, 2018."

"Aga m anọgide na otu PDP na agbanyeghị mmaja ha niile."

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Akụkọ ndị ga-amasị gị: