#Ipobsitathome: Ka o si gaa na Sept 14

Taa ndị bi n'Ọwụwa Anyanwụ nọ n'ụlọ iji kwanyere ndị nwụrụ n' 'Egwu Eke' ndị agha gbara n'ala Igbo n'afọ 2017.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uche Akolisa

  1. Ndewoonụ

    Ebe ka anyị n'apịachi ya na #Ipobsitathome:Ka o si ga.

    Sonyere anyị ụbọchị ọzọ.

  2. Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia

    Ụfọdụ na-ekwu na ihe mere ha jiri sonye bụ ịkwanyere ndị nwụrụ oge ndị agha Naijiria gbara 'Egwu Eke' ugwu.

    Ụfọdụ na-ekwu ihe ndị mere n’akụkụ ebe ha bi taa.

  3. Arịarịa, Aba dịka ebe a gbara ọsọ

    Ahịa niile dị n'Aba gụnyere Arịarịa azụghị taa.

    Iro tọgbọ chakoo ka ọzara.

    Arịarịa,Aba

    Ebe foto si, Emmanuel Izuchukwu

  4. N'Aba,Port-Harcourt ndị mmadụ apụtaghị

    Ndị Aba na Pọtakọt sonyere na#Ipobsitathome

    Ahịa Arịarịa

    Ebe foto si, Emmanuel Izuchukwu

  5. Okigwe esonyeghị

    Ndị bi n' Okigwe dị n'Imo steeti, na-agara onwe ha ihe dị ha mkpa ha taa.

    Ahịa zụrụ, ụgbọala na ọha ndị mmadụ na-agagharịkwa na enweghị nsogbu ọbụla.

    Okigwe Roundabout
    Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-agara onwe ha mkpa ha n'Okigwe tata
  6. Asaba na Owere esonyeghị

    Ndị bi Asaba, isi obodo Delta steeti na-agara ụwa ha ebe dị ha mkpa.

    Ahịa zụrụ, ụlọọrụ na ụlọ akwụkwọ mepekwara

    N'otu aka ahụ, Owere, isiobodo Imo steeti egeghị nti n'ihe ndị Ipob kwuru.

    Ụgbọala na ndị mmadụ na-aghararị dịka o si dị ha n'obi.Otu Onye bị n'Owere bụ Christian Asimole gwara BBC na "ebe niile na-ekpo ọkụ."

    Owere taa

    Ebe foto si, Christian Asimole

  7. 'Coal City na-ekwo ka o si ekwobu

    Ahịa dịka Ogbete dị n'Enugwu zụrụ.

    Ndị ọrụ na steeti ahụ gara ọrụ ka na o nweghị ihe na-eme taa.

    Aha onyonyo, #Ipobsitathome: Ihe mere n'Enugwu
  8. Nọrọnụlọ IPOB kpọrọ enweghị isi n'Enugwu

    Oku ahụ otu na-azọ ka Biafra kwụrụ onwe ya bụ IPOB hibere tata bụ"onye ọbụla nọrọ n'ụlọ ya" bụ nke achịtaghị aja n'Enugwu steeti.

    Ụbọchị tata bụ Seputemba 14 dịka ụbọchị ndị ọzọ ''ihi na ndị ahịa na-azụ.

    Ogbete na ahịa ndị ọzọ zụrụ, ebe ụlọọrụ dị iche iche dịkwa ka o si adị.

    Onye ntaakụkọ BBC Igbo kwuru na ndị ojiegoachụego na ndị ọkwọụgbọala nọkwa na-akpata ego ha.

    Ahịa Ogbete,Enugwu
  9. Nnewi dara jụụ

    Na Nnewi, ọtụtụ ndị mmadụ n'ụlọ ha.

    Ahịa azụghị.

    Nkwo Nnewi, Ahịa 'Machine Parts' na ndị ọzọ mechiri emechi.

    Naanị ndị a hụrụ bụ ndị na-ebughari ihe orir dịka ọkpa.

    Ụgbọala agbaghị karịa ụfọdụ ndị nwe nke aka ha.

    Ụlọakụ niile dị na Bank Road emepeghị karịa otu( anyị a chọghị ịkpọ aha ya) nke si azụ ụlọ anabata ndị bịara ụlọọrụ ha iwere maọbụ tinye ego.

    Otu onye bị na Nnewi achọghị ka ackpọ aha ya gwara BBC Igbo na ọtụtụ mmadụ apụtaghị n'ihi egwu ndị uweojii na-erugharị ebe niile n'ụtụtụ taa.

    Bank Road,Nnewi

    Ebe foto si, Emmanuel Akosa

    Nkọwa foto, Lee Bank Road na Nnewi,ebe na-azụbu ka ahịa mana taa, mmadụ, ọgbatumtum nakwa ụgbọala kọrọ ụkọ
  10. Ọnịcha tọgbọrọ chakoo

    Ọtụtụ ebe n'Ọnicha dịka ebe a gbara ọsọ dịka ndị mmadụ n'ụlọ ha.

    Ụgbọala agbaghị, nke ahịa n'azụ.

    Ahịa azụghị n'ụlọahịa dị iche iche nọ n'ọnicha dịka 'Main Market, Ogboefere, Upper Iweka wdg.

    Otu onye bi n'Ọnicha gwara BBC Igbo na ndị uweojii na ndị agha juru ebe niile n'akụkụ ebe ha bi.

    O nweghị ihe mberede ọbụla mere kama ndị bị n'Awada kwuru na ha nụrụ ụda egbe n'ụzọ ụtụtụ taa.

    Ebe Ọgboefere

    Ebe foto si, Uchenna Udigwe

  11. Ndị kwe na ndị ekweghị

    Ndị otu Ipob kpọrọ oku ka Ndigbo nọrọ n'ụlọ n' ụbochi taa bụ Septemba 14,2018, iji kwanyere ndị ha na-ebo ebubo na ndị agha Naijiria gburu oge 'Egwu Eke' ha gbara n'ala Igbo n'afọ 2017.

    Mana ọ bụghị mmadụ niile kwenyere n'oku ha kpọrọ.

    Otu ndị Igbo ruru iri na abụọ gụnyere 'Eastern Consultative Assembly' na 'Igbo Youth Movement(IYM)' kwadoro anọmnụlọ ahụ, ebe otu Biafra Independence Movement(BIM) nke Ralph Uwazuruike nọ n'isi ya akwadoghị ya.

    Ralph Uwazuruike

    Ebe foto si, Getty Image

  12. #Ipobsitathome: Ihe na-eme n'Igbo

    Egwu amaghị ihe ụbọchị ga-abụ mere n'ọtụtụ ndị mmadụ bi n'Ọwụwa Anyanwu apụtaghị n'ụtụtụ taa dịka ndị uweojii na-agaghara n'ihe ha kpọrọ 'igosi ike' nke ha kwuru bụ iji gbaa ndị mmadụ ume na ha dị njikere ichekwa ha.

    Obodoukwu Road,ebe Ahịa Ogboefere n'Ọnicha

    Ebe foto si, Uchenna Udigwe