Workers Day: Ka o si gaa na mpaghara ọwụwa anyanwụ

Ebe foto si, Ebonyi state government
Gọvanọ David Umahi nke Ebonyi steeti ekwetala ịkwụ ndị ọrụ steeti ya ụgwọ opekatampe ọhụrụ.
O kwuru nke a n'emume emere ụbọchị a na-echeta ndị ọrụ na mba ụwa niile na steeti ahụ.

Ebe foto si, Ebonyi state government
Umahi kwara arịrị maka etu esi mee ndị ọrụ n'akụkụ ụwa niile ma kwuo na ọ ga-agba mbọ hụ na ọ hụrụ maka ọdimma ndị ọrụ steeti ahụ.
Ndị ọrụ nọ na steeti mpaghara ọwụwa anyanwụ dị iche iche chọrọ ka ebido mezue nkwa ụgwọ ọnwa ọhụrụ gọọmenti kwere ha.
Ha kwukwara etu ụgwọ a ga-esi metụta ndụ ha.
Gere ya.
Ugwuanyị wepụtara N100milion maka ịkwụ ndị ọrụ n'ala ezumike kwa ọnwa

Ndị ọrụ mpaghara ọwụwa anyanwu anaghịkwa achị dịka ha pụtara n'igwe isonye n'emume ncheta ndị ọrụ na mba ụwa niile.
Gọvanọ Ugwuanyị nke Enugu steeti kelere ndị ọrụ steeti ma kwe nkwa na ya ga na-akwụ ha ụgwọ ọnwa n'oge.
O kwere nkwa na n'ọchịchị ya ga-ahazi ihe gbasara ikwụ ụgwọ opekatampe nkeọma.

Onyeisi ndị ọrụ na steeti Enugu bụ Chukwuma Igbokwe chetara gọvanọ Ugwuanyi na ndị ọrụ na-ahụ maka mmiri na steeti ahụ enwetebeghị ụgwọ ezumike nka ha.
Ndị ọrụ ọwụwa anyanwụ kwụ n'ahịrị na-azọ ka dịmkpa na-enweghị ụjọ ọbụla.

Ụfọdụ n'ime ha yi uwe di icheiche iji me ka ebe niile chakee.
N'owerri,

Ndị ọrụ pụtara n'uju n'Owerri Imo steeti.












