Workers day: Ihe ikwesiri ịma maka ụbọchị ncheta ndị ọrụ

Ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee afọ dum ka ndị ụwa wepụtara maka ịcheta mbọ ndị ọrụ Bekee na-agba n'ụwa gba gburugburu.
Ihe ndị bụ ihe ịkwesiri ịma maka ụbọchị a pụrụiche bụ ụbọchị ezumike ndị ọrụ na Naịjirịa nakwa mbaụwa niile.
Na Naịjirịa
Naịjirịa malitere ịnye ezumike maka ụbọchị ncheta ndị ọrụ n'afọ 1981 mgbe Shehu Shagari na-achị.
Ọ mere nke a maka ịkwado mbọ ndị ọrụ Bekee gbara nakwa nke ha ga-agba n'ọdịnihu na nkwado gọọmentị etiti nakwa nke steeti.

Ebe foto si, Igwe Kelechi
kemgbe ahụ, ndị ọrụ na steeti niile dị na Naịjrịa na-enwe ezumike n'ụbọchị dị otu a.
Ha na-agakwa akwụ n'ahịrị n'ọgbọ egwuregwu nọ n'isi obodo dị iche iche bụ ebe onyeisiala maọbụ gọvanọ steeti ga-ekwu okwu dịmkpa metụtara ndị ọrụ.

Ebe foto si, Igwe Kelechi
Na Mbaụwa
Ụbọchị ncheta ndị ọrụ malitere na Chikago mba Amerịka n'afọ 1886 bụ ebe ndị ọrụ nọ gbaa abụbụọrụ maka mmegbụ, ogologo awa ha na-arụ ọrụ nakwa obere ego a na-akwụ ha.
Akụkọ kwuru na mmadụ asatọ nwụrụ na ngagharịiwe ha mere bụ nke butere abụbụọrụ nke mere ha ji siwe ọnwụ itinye naanị awa asatọ n'ọrụ kwa ụbọchị.

Ebe foto si, Igwe Kelechi
N'oge mbụ, ha na-arụ ọrụ awa iri na ise, mana ka ha gbachara abụbụọrụ a ha malitere itinye naanị awa asatọ n'ọrụ.
Ọ bụghị mbaụwa niile na-enwe ezumike n'ụbọchị dị etu a.
Ebe ụfọdụ obodo na-akpọ ya "Labour Day", ndị ọzọ na-akpọ ụbọchị taa "Workers Day".









