Ihe gọọmentị kwesiri ịme iji gbalahụ 'Recession'

Nwaanyị na-azụ ahịa

Ebe foto si, Getty Images

Ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba obodo bụ Okechukwu Okere adụọla gọọmnetị etiti ndụmọdụ.

O kọwara na gọvanọ ndị steeti na-eti mkpu nwere ikike iti ya bụ mkpu.

Ọ sị na ọ bụ maka na ọtụtụ ihe metụtara ọchịchị na akụnaụba obodo adabanyeghị.

Gịnị bụzị usoro ga-agbanwe ihe?

Aha onyonyo, Ụlọọrụ Andersen Tax akọwala ụzọ a na-esi agbakọ ụgwọ ụtụ isi

Okere kọwara na gọọmentị etiti kwesiri ime Naịjirịa ka ọ bụrụ obodo ebe azụmahịa dị mfe site na Restructuiring.

Nke a pụtara na steeti dị icheiche agaghị atụkwasị anya n'ego gọọmentị etiti na-enye ha.

Ya mere na steeti dị icheiche kwesiri ịkwalite akụnaụba obodo nke ha.

O kwukwara na e kwesiri ịnwe mkparịtaụka n'etiti gọọmentị na steeti ndị a iji chọpụta ụzọ ha ga-esi mezuo ya bụ ihe.

Na ngwụcha, o kwuru na inye steeti ndị a enyemaka bụ ihe ga-eme ka ha kwuru n'onwe ha n'oge adịghị anya.