Ụtụ anwụrụ na mmanya na-aba n'anya etinyela ego

Aṅụrụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Naanị ndị rugoro afọ iri na asatọ kwesiri ịse aṅụrụ na Naịjirịa

Gọọmenti Naịjirịa amala ọkwa na ha ga-etinye ego n'ụtụego anwụrụ na mmanya ike.

Mịnịsịta na-ahụ maka ego bụ Kemi Adeosun kwuru na nke a bụ iji nwetakwuo ego nye gọọmenti ma belata nsogbu ahụike ihe ndị ha na-akpata.

Ntinye ego a pụtara na otu osisi aṅụrụ maọbụ otu sentilita mmanya ọkụ etinyela ego rue pasentị isii ụtụ.

Ego a ga-emetụta mmanya biya na stawụtụ, wayịnị na mmanya ọkụ mana enyela ndị ahịa na ndị na-ere ere ohere rue mkpụrụ ụbọchị iri itoolu tupu ụtụ a ebido.

Gọọmenti ekwuola na ọ ga-ebido ụtụ nwayọ nwayọ bido n'afọ 2018 rue afọ 2020.

Ndị ihe metụtara ekwubeghi ihe ọbụla banyere ọkwa a mana akụkọ na-ekwu na ihe ruru mmadụ nde na Naịjirịa anaghị anọli ma ha aṅụghị mmanya ike maọbụ anwụrụ.

Ebe ọ bụ na Naịjirịa na-enwe nsogbu na akụnaụba ya, gọomenti na-ele anya isi n'ụtụ a nweta ọtụtụ ego na dola bido n'ọnwa Juunu afọ a.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ