Sịnetị: Bịa gwa anyị ihe mere na Benue Steeti

Ebe foto si, @bukolasaraki
Ndị ụlọ omeiwu Sịnetị akpọla onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris oku ka ọ bịa zara ọnụ ya n'ihe mere ọ nwụchibeghị ndị na-achị ahụ wakporo Steeti Benue ma gbuo mmadụ iri asaa na atọ.
A gwara Idris ka ọ wuchịe n'ihu Kọmitti na-ahụ maka ihe gbasara ndị uweojii n'ụbọchị taa bịa kọwa ihe mere ojiri nupuisi na mkpebi ndị ụlọ ọmeiwu mere nke sịrị ya nwuchie ndị ọchị ehị ma kpụpụ ha ụlọikpee.
Ndị kọmitti a ga-akọwara ndị Sịnetị ihe ha kwupụtara n'abalị isii n'ọnwa febụrụwarị ka ihe ụzọ enwere ike ime gbasara ọnọdụ ahụ.
Cheta na ndị ụlọ ome iwu Sịnetị n'ọnwa jenụwarị nyere onyeisi ndị uweojii ịzụka abụọ maka ịchọpụta ma nwechie ndị na-achị ehị a na-enyoenyo nke gụrụ n'abalị abụọ gara-aga
Sịnetọ Joshua Lidani nke Gombe Steeti chetara ndị Sịnetị maka ọgwụgwụ oge ahụ enyere onyeisi ndị uweojii, kwuo ka a gwa Idris ka ọ wụchie n'ihu ha.
Onye onyeisi ndị Sịnetị bụ Bukola Saraki gosipụtara iwe ya n'ebe onyeisi ndị uweojii nọ, wee gwa ndị kọmitti na-ahụ maka ndị uweojii ka ha kpọ onyeisi ndị uweojii ka ọ wụchịe n'ihu ha.
Saraki kwuru, "Anyị ga-eme ka odo ndị nchekwa anya na ọkwa ndị Sịnetị nyere ndị nchekwa obodo abụghị ihe a na-eleda anya."
"Ndị Sịneti agaghị agba nkịtị ka ihe na-emebi n'obodo."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post









