Kedu ihe ofe Egusi gị na-enye ahụ gị?

Ebe foto si, Adline Okere
Ofe egusi bụ otu ofe ndị Igbo na-ejighi egwu egwu.
Ndị Igbo na mpaghara etiti Sahara na-eri ya nke ukwu ma jiri ya eleta ndị ọbịa.
A na-esikwa ya ebe a na-eme mmemme dịka ịgbankwụ, ikupụtanwa maọbụ ebe a na-akwa ozu.
Ọ bụ ofe ndị Igbo ji eme ọnụ mana tupu ọ bụrụ ofe, ọ na-agafe ọnọdụ dị icheiche.

Egusi bụ mkpụrụ na-esi ike elili a na-ekpepụ okpokoro azụ ya tupu akwọọ ya maọbụ sie ya.

Ọbụghị sọ ofe ka eji egusi esi, ụfọdụ ndị mmadụ na-eye ya eye a taa dịka ahụekere.

Mana kedu ihe Egusi gị na-enye gị n'ahụ?
Proteni (Protein) nke na-edozi anụ ahụ ruru ihe dịka pasenti 30 rue 40
Abuba (fat) rukwara ihe dịka pasenti 30 rue 40
Nri na-enye ike n'ahụ (Carbohydrate) ruru pasenti 10
Vitamin A, B1, B2, Ch na vitamin E, nke alfa-tokoferol so cha ihe no n'ime egusi.
Alfa-tokoferol na-enyekwa aka ime ka ahụ mmadụ dịka ọ kabeghi ma na-enyekwa aka maka ọmụmụ nwa.
Ihe dịka kalori 462 nọ n'ime otu efere ofe Egusi.

Egusi bụ ofe a na-eji ụtara dị icheiche eri.

Ebe foto si, Getty Images
A na-ejiụtara akpu, ụtara ji, garrị, ụtara ọka, ụtara osikapa na ndị ọzọ eri ofe egusi.
Ụfọdụ ndị mmadụ na-ejikwa ofe egusi eri osikapa.
Etu ọbụla ịchọrọ iri ya, racha aka gị nke ọma mgbe ị na-eri ofe egusi.









